Akwaeke Emezi: 'Ọgbanje' Igbo ji eme ọnụ

Akwaeke Emezi Image copyright Instagram/AZEMEZI

Akwaeke Emezi bụ nwaafọ Igbo emetela ihe ndị mmadụ ji kpụrụ ya n'ọnụ na mbaụwa.

Ị na-ajụ ihe o mere? BBC Igbo ga-aza gị.

Emezi sị na ọ bụ "Ndị" (n'ihi na ọ bụghị nwoke maọbụ nwaanyị) toro n'Aba dị n'Abịa steeti, dere akwụkwọ ndị bekee chọrọ iji mee ihe ejije bụ nke a na-akpọ "film" na bekee.

O biputara ya bụ akwụkwọ wuru ewu, nke a kpọrọ "fresh water" n'afọ 2018; otu afọ ka o nwetachara nturuugo n'asọmpi edemede nke Common Wealth e mere n'afọ 2017.

Iji gosi gị na Igbo nwere mmadụ, Emezi sozi ndị odeakwụkwọ e ji ama atụ dịka Flora Nwapa, Chimamanda Adichie, Buchi Emecheta wdgz.

Ihe ndị ọzọ ị kwesịrị ịma maka ya:

  • O toro n'Aba n'agbanyeghi na a mụrụ ya n'afọ 1987 n'Ụmụahia.
  • Nna ya bụ onye Igbo ebe nne ya bụ onye Tamil, na mba Maleshia.
  • O nwetere asambodo "International Politics and Nonprofit management" na mahadum New York n'afo 2012, ma gụkwaa "Creative writing" site n'afọ 2014 ruo 2016, na mahadum Syracuse dịkwa na New York.
  • Emezi na-akpọ onwe ya ma na-ekwu na ọ bụ ọgbanje.
  • O wepụrụ akpanwa ya n'ihi na o kwetere na ọ bụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị.
  • O kwenyekwara na ọ na-anụ olu atọ dị iche iche na-agwa ya okwu.

Akụkọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara