Budget 2019: Buhari etinyela aka n'akwụkwọ

Onyeisiala Buhari biyela aka Bọjeti 2019

Buhari ebe ọ na-anyeaka na Bọjet 2019 Image copyright BashirAhmed/Twitter

O ruola n'omume, onyeisiala Buhari biyela aka Bọjeti 2019.

Bashir Ahmed onye na-enye onyeisiala Buhari aka depụtara akụkọ a n'igwe Twitter ya:

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo IPOB bidoro nghaghari iwe ya n'afọ 2012

Ndị otu Ipob ekwuola na ọ bụrụ na ndị ọnụ na-eru n'okwu bidoro n'oge kwuwe maka ịmanye Naịjirịa n'okpukpere chi Alakuba , ihe akarị mebi etu ọ dị ugbua.

Emma Powerful bụ ọnụ na-ekwuru otu IPOB kwuru na okwu 'Fulanisation ' aka chiburu Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo bụ okwu Nnamdi Kanu na-ekwuritọ kamgbe.

Cheta na Obasanjo kwuru na ọ bụrụ na-eji aka ike wee ibuso ndị omekome akpọrọ Boko Haram na otu ndị ọzọ na-akpa mkpa mkpa na mpụ ha na-eme karị ịbụ akụkọ ochie.

Ndị uweojii nọ na Jos ekwuola na ọtụtụ mmadụ nwerike so na ndị nwụrụ anwụ n'ọgbaghara ọhụrụ mere na steeti ahụ.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Mathias Tyopev kwuru na ndị otu ya agaala na mpaghara ahụ imenyụ ọgụ a dapụtara ụnyahụ na Dutse Uku, Rikkos nakwa Cele Bridge.

Ụlọ a na-arụ kamgbe afọ 20 adaala n'Owerri

Image copyright Uche Akolisa
Nkenke aha onyonyo Ụlọ ọzọ dara ma dakwasị ndị mmadụ na mpaghara Oke-Arin dị na Lagos Island.

Dịka ndị Anambra ka na-enyocha ihe kpatara ụlọ ji daa n'Onicha, ụlọ ọzọ adaala n'Owerri mana akụkọ na-ewunu bụ na mmadụ anọ sepụtara isi na ya bụ ihe mberede.

N'egwuregwu,

Image copyright Getty Images

Onyeisi otu egwuregwu Manchesyter city bụ Khaldoon Mubarak ekwuola ndị ibe ha na-ewuru ha anyaọkụ maka etu ha si eme nkeọma n'egwuregwu bọọlụ.

Cheta na ọ bụ ha bu otu egwuregwu beekee bu ụzọ merie iko eguregwu dị iche iche ugboro atọ dịka ha merichara watford na iko FA ọkpụ goolu isii asataghị otu.

N'ofesi,

Image copyright Getty Images

Ihe mberede ụgbọ mmiri mere na Dr Congo egbuola mmadụ ruru mmadụ iri atọ gụnyere ọtụtụ ndị nkụzi gara ịnata ego ụgwọ ọnwa ha.

Image copyright Getty Images

Ebe ndị omekome gbagburu mmadụ anọ n'ụlọụka Katọlik dị na Burkina Faso mgbe a na-aka ụka Sunday.

Nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịko taa niile

Ihe nkiri

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionMigraine headache: Ihe oke isiọwụwa na-eme n'ụbụrụisi