Michael Okpara University of Agriculture: Mmiri gbagburu ụmụakwụkwọ abụọ na Mahadum anyị

Mahadum Image copyright @mouauabiastate
Nkenke aha onyonyo Odefa kwuru na a na-eche na ọ bụ oke mmanya butere ọnwụ ụmụaka a

Mmiri agbagbuola ụmụakwụkwọ abụọ Mahadum Michael Okpara University so ndị otu ha ga inwe obi ụtọ n'ụlọ oriri na nkwari.

Adamma Odefa bụ ọnụ na-ekwuru Mahadum ahụ gwara BBC Igbo na ebugala ozu ụmụakwụkwọ abụọ ahụ n'ụlọọgwụ kamgbe ihe a mechara.

O kwuru na otu n'ime ha nọ afọ anọ ya ebe onye nke ọzọ anọọla afọ atọ na Mahadum Michael Okpara University of Agriculture.

Odefa kwuru na a na-eche na ọ bụ mmanya na-ebu ụmụaka ahụ mere ha ji danye na mmiri amaghị ama.

N'ọnụ ya, " anyị na-atụ anya na ndị bee ha ga-abia taa iburu ozu ha ma emecha nyocha ihe kpatara mmiri ahụ ji gbagbuo ha."

Mbọ niile BBC Igbo gbara ịnụta n'ọnụ ndị uweojii nọ na steeti ahụ kpụrụ afọ n'ala. Mana anyị ka na-anwa.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: