Adewura Bello: Etu ololu 'si loo' nwa agbọghọ na Lagos

Ebe a na-eche na o riri Adewura Bello
Nkenke aha onyonyo Ebe a na-eche na Adewura Bello dabanyere

Ka ezinaụlọ Adewura Bello na-agba mbọ ịchọta ya site n'ụbọchị nke iri na ise nke ọnwa Mee, ha amaghị na ọ fọrọ nwantakịrị ka ọ laruo tupu ọdachị adakwasị ya.

Ụnyaahụ bụ ụbọchị 26 nke ọnwa Mee ka ozi pụtara na soshal midia na a hụla ozu ya bụ nwa ada.

Akụkọ so ya bụ na ọ dabara n'ọwa mmiri ka nnukwu mmiri zochara ụbọchị ahụ, e wee gụpụta ozu ya ebe tere ezigbote aka ka o mere abalị iri na otu e bidoro chọwa ya.

Otu onye sị na ọ bụ nwanne ya nwoke, dere na Twitter na obi na-amapụ ya mgbe ọbụla ọ hụrụ na a ka na-achọ ya achọ:

Onye ọzọ sịkwa na ọ bụ nwanne ya dere na a hụla ozu ya.

Akụkọ etu nke a si mee gbagwojuru anya nke mere BBC Igbo ji gaa ime nchọpụta nke bụ eziokwu, wee hụta ebe ya bụ ihe mere ma gbakwa ndị hụrụ mgbe o mere, ajụjụ ọnụ.

Ihe anya hụrụ kwuru

Otu nwoke achọghị ka e dee maọbụ kwuo aha ya gwara BBC Igbo na ọ bụ ọgbatumtum bu onye o che na ọ bụ Nwaada Bello na ala be ha danyere n'ime idemmiri.

Ka ha si kọwa, onye ọgbatumtum pụtara mana dịka mmiri ahụ ji ike aga, o buru nwat nwaanyị banye n'ime ihe Bekee kpọrọ 'sewage'.

Nkenke aha onyonyo Ahmed Onipede si na o teela ha na-arịọ gọọmentị ka a bịa mezie 'manhole' ahụ mebiri

Ndị bi nso n'ebe ihe a mere si na o teela ihe Bekee kpọrọ 'manhole' n'etiti ahụ mebiri, "mana gọọmentị achọghị imezi ya".

Ugbua, otu onye o metụrụ n'obi ewerela igwe gbachite oghere 'manhole' ahụ, maka igbochi ọdachị ọzọ.

BBC Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Legos steeti bụ Bala Elkana maka okwu a.

Nkenke aha onyonyo 'Manhole' nke dị n'ihu nke a na-eche na o buru nwaada Bello na-achọkwa ịda

Maazị Elkana kwenyere na o nwere ozu a hụrụ n'ime awa mmiri, mana ọ gara n'ihu kwuo na amabeghị ma ọ bu nwaada ahụ a na-achọ.

Agbanyeghị nke a, ozi ruru BBC Igbo ntị bụ na e liliela Adewura Bello.

Mbọ BBC gbara inweta ndị nwe ya amịtaghị mkpụrụ makana a sị na ha achọbeghị ka ndị ntaakụkọ ruo nso.

Otu onye achọghị ka e kwuo aha ya gwara anyị na o so gaa ya bu olili.

Ked ihe bụ 'manhole'?

Nkenke aha onyonyo Otu onye o metụrụ n'obi agbachiela ebe a na-eche na Adewura Bello si danye n'ime olulu

Mgbe gọọmentị hibere Gowon Estate na ụfọdụ ebe a rụrụ ụlo maka obibi ndị mmadụ (Festac na Jakande estate sokwa) n'afọ 1976, ha rụrụ ya ka ọwa mmiri nakwa ebe nsị ga-esi pụọ, dị n'ime ala.

Bekee na-akpo ụdịrị ọwa mmiri a 'Sewage System'. Na Festac, ọwa mmiri a na-ebuga nsị ebe akpọrọ 'Sewage Treatment Plant' ebe a ga-awa ya hụ na ihe nwereike inye mmadụ ọrịa adịghị na ya tupu ahapụ mmiri a ka ọ banye osimiri.

Ihe Bekee na-akpọ 'manhole bụ oghere e nyere ha ndị ọrụ si na-aba ime ọwa mmiri ma e nwee mgbochi maọbụ a chọọ ka a rụọ ọrụ ebe ahụ.

Ebe onye eche na ọ bụ Nwaada Adewura Bello danyere bụ otu n'ime manhole a dakasịchara.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara