May 29 2019 in Nigeria: Mbanye ọchịchị ọhụrụ

Buhari Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo A na-enyefekarị aka ọchịchị n'ọnwa May 29 ma emecha ntụliaka onyeisiala

Oge akara aka eruwo! makana agha akara aka anaghị eri ngwọrọ.

Taa onye ọkaikpe kachasị na Naịjirịa bụ Tanko Mohammed ga-edu onyeisiala Muhammadu Buhari na osote ya bụ Yemi Osinbajo n'iyi ọrụ n'emume pụrụiche a ga-eme n'ọgbọ Eagles' square dị n'Abuja.

Ị ga n'ọgbọ egwuregwu Eagle Square ị ga-ahụ na o yi uwe ọhụrụ maka emume nyefeaka ọchịchị taa.

Na steeti ruru iri abụọ na itoolu, a ga-edukwa ndị gọvanọ n'iyi ọrụ.

Ụfọdụ n'ime ha na-enyefe ọchịchị n'aka ndị ọzọ, ebe ụfọdụ na-abanye agba nke abụọ ha n'ọchịchị.

Lee Gọvanọ ndị a na-edu n'iyi ọrụ taa

Okezie Ikpeazu (Abia),

Ifeanyi Ugwuanyi (Enugu),

Dave Umahi (Ebonyi),

Ifeanyi Okowa (Delta),

Emeka Ihedioha (Imo)

Nyesom Wike (Rivers),

Udom Emmanuel (Akwa Ibom),

Ben Ayade (Cross River),

Babajide Sanwo-Olu (Lagos),

Seyi Makinde (Oyo),

Adedapo Abiodun (Ogun),

Darius Ishaku (Taraba)

Samuel Ortom (Benue).

Nasir El-Rufai (Kaduna),

Abdullai Gandu- je (Kano),

Aminu Tambuwa (Sokoto),

Mohammed Mattawale (Zamfara),

Atiku Bagudu (Kebbi),

Mohammed Bala (Bauchi),

Solomon Lalong (Plateau),

Ahmadu Finitri (Adamawa),

Babagana Zulum (Borno)

Mai Mala Buni (Yobe).

Aminu Masari (Katsina),

Muhammad Yahaya (Gombe),

Abdulrahman Abdulrazaq (Kwara)

Muhammad Badaru (Jigawa),

Abubakar Bello (Niger)

Abdullahi Sule (Nasarawa).

Gọvanọ ndị dịka Seriake Dickson (Bayelsa), Yahaya Bello (Kogi), Kayode Fayemi (Ekiti), Rotimi Akeredolu (Ondo), Godwin Obaseki (Edo), Willie Obiano (Anambra) nakwa Gboyega Oyetola (Osun) ka nọ n'ọkwa ha.

Soro anyị na Facebook anyị bụ "BBC News Igbo" nakwa Website anyị bụ "BBC.com/Igbo" dịka anyị ga-agba mbọ wetere gị emume ndị ka o si agaa taa n'akụkụ Naịjirịa dị iche tụmaadị na mpaghara ọwụwa anyanwụ.

Akụkọ ga-amasị gị: