Ipob sit home: N'Ọnịcha na Nnewi ihe Igbo kpụ n'ọnụ bụ Mee 30

Ndị na-achọ nnwereonwe Biafra Image copyright Getty Images

Dika ọ fọrọ naanị otu abalị ka a banye Mee 30, bụ ụbọchị ncheta afọ iri ise na otu a lụrụ Agha Biafra, okwu a kpụ n'ọnụ na mpaghara ụfọdu n'ala Igbo - ọkachasị n'Ọnịcha na Nnewi - bụ ịnọ n'ụlọ dịka otu Indegenious People of Biafra (Ipob) kpọrọ ndị otu ha na Ndigbo nile.

Onye ntaakụkọ BBC Igbo onye kpagharịrị n'obodo abụọ ndị a ụbọchị Mee 29 hụrụ ọtụtụ ndị mmadụ gbakọrọ n'ahia nakwa ọdọ ụgbọala na-ekwu maka ya bu oku Ipob kpọrọ.

Onye ntakụkọ anyị hụkwara akwụkwọ mgbasaozi nke n'agbasa ozi n'akpo oku ka onye ọ bụla nọrọ be ya n'ebe dị icheiche na Nnewi.

Ndị e chere na ha bụ ndị otu Ipob bụ ndị yicha ihe na-eyi egwu dapụtara n'ụfọdọ akụkụ kpagharịa ma minakwaa.

Otu onye achọghị ka akpọ aha ya gwara BBC na ya na ndị enyị ya na ndị ya na ya na-azụkọ ahịa agaghị apụta.

"Echi ga-adị kpọ kpọ. Ndị mmadụ na-ekwu na ha agaghị apụta echi."

N'Ọnicha, onye ntaakụkọ anyị hụrụ ọtụtụ ndịagha bu ụgbọala ha na-akpagharị ka ha jupụtara.

Ndị uweojii nọkwa n'ebe ụfọdụ ọtụmadị na "Headbridge" Onicha.

Ewepu ndịagha na ndị uweojii, obodo dere jụụ n'Ọnịcha dịka ọtụtụ ndị bi Onicha, ndịọrụ na ndị ahịa na-aga mkpa ha na-enweghị nsogbụ ọbụla.

Cheta n'izu ole na ole gara aga, otu Ipob kpọrọ ndị otu ha oku ka ha nọrọ n'ụlọ iji gosi iwe maka ndị e chere na ndị Fulani na-achị ehi gburula.

Image copyright Tonie Iwoba
Nkenke aha onyonyo Akwa mmiri Niger tọgbọ chakoo n'agbanyeghị na ọ bụ ebe ụgbọala na-ejukarị na-ebute ịga nwayọ nwayọ na 'site at home' nke 2018