Olusegun Obasanjo: O nweghi mberede ụgbọelu ọbụla m so n'ime ya

Obasanjo

Aka chịbụrụ Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo ekwuola na ya nọ na be ya na Abeokuta, isi obodo Ogun steeti, na ya agaghị njem ọbụla.

Nke pụtara na onweghi etu ọ ga-eji soro na mberede ụgbọelu.

Obasanjo kwuru nke a ka akụkọ pụtara na o so n'ime ndị nọ n'ụgbọelu gbalahụrụ mberede n'ọdọụgbọelu dị na Legọs.

Ọnụ na-ekwuru Obasanjo bụ Kehinde Akinyemi, gwara BBC na onyeisi ya nọ n'ụlọ, na onweghi ebe ọ gara.

Akụkọ a na-ewu kwuru na Obasanjo nọ n'ime ụgbọelu Ethiopean Airline nwere nsogbu mgbe ọ chọrọ ifetụ n'ọdọụgbọelu Muritala Muhammed dị na Legọs.

Maazi Kehinde gwara BBC Yoruba na Obasanjo nọ ya n'akụkụ ka o na-aza ekwentị, ma gbalikwa ụda olu ekwentị ka onye ntaakụkọ nụ olu ya.

Obasanjo sị na ya abaghị ụgbọelu gaa ebe ọbụla taa.

N'otu aka ahụ kwa, onye na-ekwuchitere ngalaba na-ahụ maka ụgbọelu bụ "Federal Airports Authority" bụ Henrietta Yakubu, gwara BBC Pidgin na ọ bụ eziokwu na ụgbọelu Ethiopia Airline nwere obere nsogbu ka ọ chọrọ ifetu.

"Ka ha chọrọ ifetu, ha nwere nsogbu, mere ka ụgbọelu ahu felie elu ọzọ, wee fetuzie na-enweghi nsogbu."