Chelsea vs Arsenal: Etu ọ sọrọ ụwa ya mee, Arsenal gba aka iko n'afọ a

Chelsea lụrụ Arsenal ka nwaanyị Image copyright EPA
Nkenke aha onyonyo Chelsea lụrụ Arsenal ka nwaanyị

Egbe ndị Arsenal ji bịara Chelsea ọgụ nyụrụ nkọ ma wụrụ osisi taa ka Chelsea ji ọkpụ anọ a satara naanị otu merie ma buru iko.

N'agbanyeghi na enweghi onye ji goolu gbawa ibe ya obi n'ọkara nke mbụ, Chelsea bịara teta na nke abụọ.

Goolu Olivier Giroud nyere na nkeji 49 na nke Pedro ji gbarie Petr Cech obi na nkeji 60, nyere ndị na-akwado ha olileanya ibulata iko a.

Ka a na-ekwu nke a na-ekwu, Eden Hazard ejiri penariti dọrikwa neetị Cech.

Unai Emery bụ onye nchịkọta Arsenal bịara webata nwaafọ Naịjirịa bụ Alex Iwobi na nkeji 66.

Na-erughi nkeji atọ e tinyere ya, na nkeji 69, Iwobi agbaa aka ahịa ozugbo, nyetu ndị Arsenal obere olileanya.

Mana Chelsea napụrụ ha mmiri n'ọnụ ha Hazard tụkwasịrị ya nke anọ na nkeji 72, iji kpọọ ntu n'akpati bu ndị Arsenal.

Image copyright EPA
Nkenke aha onyonyo Nke a mere ya ugboro abụọ Chelsea na-amabute iko Europa League a

Otu egwuregwu abụọ si mba Briten bụ Chelsea na Arsenal zutere n'isi obodo mba Azerbaijan bụ Baku, isukọta mpi ha ji mara onye bụ oke na mgbacha Iko Europa nke 2019.

Ha agbaghị ndị na-akwado ha ọtọ dịka ha si mpaghara ụwa dị iche iche wụchie Baku maka asọmpi a bụ nke ugboro 198 otu abụọ a na-ezute.

N'afọ 2015, Cech si Chelsea gafee Arsenal, mana ihe dị ịtụ n'anya bụ na asọmpi a ga-abụ nke ikpeazu ọ ga-agba n'ụdịa makana ọ na-ala ezumike nka.

Image copyright EPA
Nkenke aha onyonyo Arsenal ebee

Ndị Chelsea kara ahụ napụ Arsenal olileanya ha nwere iji awụbanye asọmpi Champions League nke afọ 2019/2020.

Emery bụ onye asọmpi Europa doro anya (Emery ebutela Iko Europa ugboro atọ), akpaghị ike makana nke afọ kwara ya.

Akụkọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a