Fada Festus Ezeamaka ekwuola na ọ bụ ndị na-amanye 'sit-at-home' wakporo ya

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIhe Fada Festus Ezeamaka kwuru maka mwakpo awaporo ya.

Ukọchukwu Festus Ezeamaka bụ fada na-edu ụka katọlịk nke Saint Jude Nnewichi dị na Nnewi agwala BBC Igbo na ọ bụ ndị ntoroọbịa na-amanye ịnọdụ n'ụlọ ụbọchị Mee 30 nke 2019 wakporo ya ka ọ na-aga ekpere ụtụtụ.

Ụkọchukwu Ezeamaka nọ n'ụlọgwụ Nnamdị Adikiwe na Nnewi anata ọgwụgwọ si na ndị a wakporo ya jụrụ ya ihe mere ojiri pụta ubọchi amachiri ngagharị.

"Ha jụrụ ma m che na ha na-egwu egwu mgbe ha si ka ndị mmadụ apụtaghị."

Gee ihe o kwuru n'uju n'ihe onyonyo dị n'elu:

Okwu Ụkọchukwu Ezeamaka gwara BBC kwadoro okwu onyeisi ngalaba na-ahu maka nchekwa na "Diocese" Katọlịk nke Nnewi bụ Ụkọchukwu Christopher Nwobi gwara BBC Igbo.

Ụkọchukwu Nwobi sị na Ụkọchukwu Festus Ezeamaka nọ n'ụzọ ịga kpee ụka ụtụtụ mgbe o zutere ndị a na-eche na ha bụ Ipob na-agụ egwu na-akpagharị na mpaghara Ibeto Junction.

Ụkọchukwu Nwobi kwukwara na a maghị ihe kpalitere ndị a, dịka Ezeamaka yi uwe ndị ụkọchukwu ma nwekwa ihe ngosi na ọ bụ ukọchukwu n'ụgbọala ya.

A kuriri ụgbọala Ụkọchukwu Ezeamaka bu ma merụọ ya ezigbote ahụ.

Nwobi sị na Ezeamaka kara ahụ nyara ụgbọala ya ruo ụlọụka ya, ebe ndị ụka si buru ya gbagawa ụloọgwụ nkụzi nke Nnamdi Azikwe, bu ebe ọ nọ ugbua.

Gee onu Ụkọchukwu Nwobi n'ujuebe a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionOkwu Fada Nwobi

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Anambra bụ Mohammed Haruna gwara BBC Igbo na onweghi nsogbu ọbụla so emume sit-at-home ya ma maka ya, ma ga n'ihu kwuo na nke a nwereike bụ maka eziteghị uweojii ozi.

Mana Ụkọchukwu Nwobi kwuru na ụlọụka Ezeamaka gbara ama ihe mere n'ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Otolo Nnewi.

Ọ si na ndị uweojii sị ka ụkọchukwu ahụ awakporo bịa ma ọ natacha ọgwụgwọ.

Na soshal midia, ndị mmadụ wepụtara ihe onyonyo na-egosi ụgbọala ha kwuru bụ nke ụkọchukwu a awakporo.

Akụwasịrị ụgbọala a, dịka ọbara metọsịri ime ya.

Ụlọ ntaakụkọ Punch buburu akụkọ na a na-eche na mmadụ ise nwụrụ mgbe ndị ụka na ndị Ipob lụrụ ọgụ, mana Ụkọchukwu Nwobi sị na o nweghị ihe dị etu a mere.

Ubọchi Mee 30 bụ oge ọtụtụ ndị mmadụ ji echeta ụbọchi ahụ n'afọ 1967 Ọchịagha Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu hibere mba a kpọrọ, Biafra.

Ipob na ụfọdụ otu na-achọ ka ekepụta Biafra na Naịjirịa na-akpọkarị oku ka ndị mmadu nọdụ n'ụlọ n'ụbọchị ahụ.

Lee etu BBC Igbo si gbasa ozi banyere ịnọdụ n'ụlo nke 2019 ebe a:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a