'Unu gbusia ndi Biafra, kedu ndị ga anọzi na ya?' - Ụkọchukwu awokporo na Nnewi
Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi

Fada Festus Ezeamaka ekwuola na ọ bụ ndị na-amanye 'sit-at-home' wakporo ya

Ụkọchukwu Festus Ezeamaka bụ fada na-edu ụka katọlịk nke Saint Jude dị na Nnewi agwala BBC Igbo na ọ bụ ndị ntoroọbịa na-amanye ịnọdụ n'ụlọ ụbọchị Mee 30 nke 2019 wakporo ya ka ọ na-aga ekpere ụtụtụ.

Ụkọchukwu Ezenweke nọ n'ụlọgwụ Nnamdị Adikiwe na Nnewi anata ọgwụgwọ si na ndị a wakporo ya jụrụ ya ihe mere ojiri pụta ubọchi amachiri ngagharị.

"Ha jụrụ ma m che na ha na-egwu egwu mgbe ha si ka ndị mmadụ apụtaghị."

Gee ihe o kwuru n'elu.