Rochas Okorocha: Akụkọ na anyị anwụrụla Okorocha bụ asị ọcha - EFCC

Rochas Okorocha Image copyright Facebook/Rochas

Ikuku ekuola, ahụ ike ọkụkọ n'asịrị na-efeghari nke na-ekwu na Rochas Okorocha abanyela na mmiri ọkụ nke ngalaba na-alụ ọgụ megide nruruaka bụ EFCC siri.

Akụkọ fegharịrị n'ụlọntaakụkọ ụfọdụ nakwa soshal midia kwuru na EFCC wakporo ma nwụchie Rochas Okorocha na nwunye ya bụ Nkechi ma gbachie mahadum ya a kporo "Eastern Palm University".

Mana EFCC gwara BBC Igbo na kepukepu ahụ na-efegharị nke kwuru na ha anwụchiela aka chịburu Imo steeti bụ Rochas Okorocha na nwunye ya bụ "okwu ụgha".

Na mkparịtaụka BBC Igbo na ọnụ na-ekwuru EFCC bụ Tony Orilade nwere na ekwentị, ọ sị "ọ bụghị eziokwu".

Otu na ndị nsonazụ Okorocha bụ FCC Jones kwukwara otu okwu ahụ.

"O nweghị ihe yiri ya mere."

"O teghị aka m si n'ụlọ Okorocha ebe ya na ezianaụlọ ya na ndị "Rochas Foundation" nọkọrọ ọ were gwa ha na ya abụzighị gọvanọ Imo steeti."

Maazị Jones sị; "Ọ (Okorocha) na-enweta onwe ya dịka ọ nọ na ezumike."

Akụkọ ga-amasị gị: