Nigeria Vs Ukraine: Flying Eagles ejirila ịbụ 'ikpeazụ ka mma' gafee

Ademola Olajire Image copyright NFF
Nkenke aha onyonyo Ndị egwu Flying Eagle gbara ọnyụba n'asompi ha na mba Ukraine

Naijiria na Ukraine nyere onwe ha otu ọkpụ otu ọkpụ n'asompi U20 World Cup nke Nigeria na mba Ukraine sọrọ n'abalị Tọzde.

Mana obi adịghị ụmụ Naijiria mma dịka ndị egwu bọọlụ Flying Eagle siri akpụla 'band' azụ n'asompị ahụ dịka ha gbara ka ehi azọsịrị nsị n'afọ.

Ụmụ Naijjiria ji iwe na ọnụma gwee Tijani Mohammed nke Flying Eagle ka ose dịka Nigeria na-agba ọnyụpa n'asompi

Tijani gbara penariti, oche goolu Ukraine echeta ya ka ọ fọrọ ntabi anya ole na ole tupu ọkara oge asompi ahụ.

Nke mere dịka Danylo Sikan nke Ukraine nyere goolu mbu ha.

Mana Tijani zọtara onwe ya oge ka o jiri penarịti ọzọ nye goolu na nkeji 47 nke asompi ahụ.

Ọtụtụ ụmụ Naijiria zisara iwe ha n'ahụ Tijani.

Lee ihe ụfọdụ kwuru:

@10Qmedia kwuru na Tijani Muhammed bụ onye bọọlụ kachasị njo na ndị na-agbara Naijiria bọọlụ.

@vic_MLS tụụ arịị na Tijani tufuru ohere penarịti ahụ.

@rappatek kwuru na onye nchịkọ Flying Eagles kara iwdepu Tijani n'oge.

@SSnetwork kwuru na ha ejighị otu obi gbaa bọọlụ.

Isiokwu Ndị Emetụtara