Naịjirịa ka ga-eso n'atụmatụ 'Africa Free Trade Agreement' -Enelamah
Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi

Africa Free Trade Agreement: Naịjirịa ka ga-eso n'atụmatụ - Okechukwu Enelamah

Dịka atụmatụ "African Continental Free Trade Area" (AfCFTA) nke ga-ewepụ mgbochi dị n'azụmahịa n'etiti mba dị n'Afịrịka malitere ụbọchị Tụsde bụ nke 30 n'ọnwa Mee 2019, onye bụbụ minister na-ahụ maka azụmahịa na Naịjirịa bụ Okechukwu Enelamah gwara BBC Igbo na uche gọọmentị Naịjirịa ka dị na ya bụ atụmatụ.

Maazị Enelamah sị na gọọmentị Muhammadu Buhari na enyocah ya bụ atụmatụ ịmata etu ọ ga-ese gara Naịjirịa nke ọma.

Naịjirịa, Eritrea na Bene bụ ndị ebinyebeghi aka n'atụmatụ n'ime mba dị n'Afịrịka.

Gee ihe Enelamah kwuru n'uju n'ihe onyonyo a.

Akụkọ ga-amasị gi: