May 30: Aka Ipob adịghị na mwakpo onye ọbụla na Nnewi - Emma Powerful

ugbọala Fada Ezenweke

Dika Ụkọchukwu Festus Ezeamaka ka nọ na-anata ọgwụgwọ n'ụlọgwọ Nnamdị Azikiwe dị na Nnewi n'ihi ahụ ndị mmadụ na-amanye ịnọdụ n'ụlo ụbọchị Mee 30 merụru ya, ndị Indigenous People of Biafra (Ipob) kpọrọ oku 'sit-at-home' etinyela ọnụ n'okwu a.

N'ozi rutere BBC Igbo aka site ọnụ na-ekwuru Ipob bụ Emma Powerful, sị na Ipob adịghị eji mma maọbu egbe agagharị, ma na-ebo gọọmentị Naịjirịa ebubo na ha na-emegide Ipob.

Emma Powerful sị na Ipob amaghị maka mwakpo ọbụla emere ndị ụka na Nnewi.

BBC Igbo jụrụ Emma Powerful maka ihe mere Ụkọchukwu Ezeamaka dada mana ọ saghị nke ahụ.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Otu Ipob kpọrọ oku sit-at-home n'ụbọchị Mee 30 nke 2019

N'ozi o zitere BBC Igbo, Powerful gara n'ihu kele ndị sonyere n'emume ncheta Biafra, ọkachasị ndị Nnewi.

Cheta na Nnewi, Onicha na Aba bụ obodo eji azụmaahịa mara n'ọwụwa anyanwụ Naịjirịa sonyere atụmatụ ịnọdụ n'ụlọ Ipob sị ka eme n'ụbọchị Mee 30.

Obodo ndị ọzọ dịka Enugwu, Abakaliki, Umuahia na Owere emeghi etu ahụ.

Ụkọchukwu Ezeamaka sị na ọ bụ mgbe ọ na-aga ịka ụka ụtụtụ n'ụlọụka, ka o zutere ndị wakporo ya ma kurichaa ụgbọala ya.

Dịka o si kwuo, njọ Ezeamaka bụ na ọ pụtara n'ezi n'ụbọchị Mee 30.

Ọnu na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra Steeti bụ Mohammed Haruna gwaburu BBC Igbo na ha amaghị maka ihe mere, maọbụ nsogbu ọbụla so emume 'sit-at-home' nke Mee 30.

Mana onyeisi ngalaba na-ahụ maka nchekwa na "Diocese" Katọlịk nke Nnewi bụ Ụkọchukwu Christopher Nwobi gwara BBC Igbo na e mere mkpesa n'ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Otolo Nnewi.