Gunmen attack at Okorocha's: Ndị uweojii na-enyocha ndị gara njem ọjọọ be Okorocha

Rochas Okorocha Image copyright Rochas Okorocha Facebook
Nkenke aha onyonyo Rochas Okorocha nọ n'agba nke abụọ dịka Gọvanọ Imo steeti

Ọnụ na-ekwuru Rochas Okorocha bụ Sam Onwuemeodo ekwuola na ya agaghị ekwu ihe ọbụla gbasara nwakpo ndị eche na ha bụ ndị okpu ara ọbara wakporo be Rochas Okorocha na Ogboko, Ideato South nke Imo State.

Ọ sị na ha "ga-eziputara ndị nta akụkọ akwụkwọ ka ya bụ nwakpo sịrị gaa ụbọchị ụka iji kọwara ọha na eze ka ya bụ arụ siri mee.

Cheta na Okorocha nwụsara ọwara dịka gọvanọ Imo steeti na 29 nke ọnwa Mee.

Kemgbe ahụ emebiela Akachi Tower n"owerri nke amabeghị ndị mere ya ruo ụgbụa.

N'ụtụtụ a ka akụkọ pụtara na ndị o ji egbe ezu wakporo be Okorocha n'ime abali Fraịde ma onweghị ihe ha weere maọbụ onye emeruru ahụ.

Nke mere ka ndị mmadụ chewa na ọ bụ ndị ogbu ara ọbara bịara njem ahụ.

Onwebeghị onye ma ihe mere ebe ahụ ruo ugbua.

Akụkọ ga-amasị gị

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a