Police killing: Onye uweojii gbagburu nwokorobia agbaala ọsọ

Christian Onuoha Image copyright Christian Onuoha/fb

Onye uweojii gbagburu nwokorobia aha ya bụ Christian Chibuike Onuoha na Afaraukwu Ụmụahịa agbaala ọsọ.

Ọnụ na-ekwuru ndi uweojii na Steeti Abịa bu Godfrey Ogbonna gwara BBC na ha ka na-achọ ya bụ onye uweojii achọ n'ihi na onweghi onye ma ebe ọ gbagara.

Aha onye uweojii ahụ bụ Collins Apugo onye ji ọkwa Sajenti.

Ogbonna kwuru na "ya bu ihe mere n'eziokwu mana ka ọ dị ugbua, onwebeghi onye ma etu o si mee ganye mgbe anwuchiri onye uweojii kpara aru ahu".

Akụkọ BBC nụrụ kwuru na ụmụokorobia nọ nso mgbe ihe ahụ mere jiiri iwe suo ugboala onye uweojii ahụ ọkụ.

Nkea abughi izizi ihe dị otua na eme. N'ọnwa Ọktoba afọ gara aga, ndị mmadị ji iwe kụgbuo otu onye uweojii ngalaba FSARS ji egbe gbagbuo onye ọrụ okporoụzọ bụ Lagos State Traffic Management Authority (LASTMA).

Ndị obodo malitere ịme ngagharị iwe nye ndị uweojii maka nke a.

Akuku ga-amazi gi:

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a