Diet and Dementia: Etu ị ga-esi jiri chocolate na-akwụkwọ nri chụọ nsogbu ụbụrụisi

Mkpụrụ osisi na akwụkwọ nri ahaziri ka ha yie ụbụrụ isi. Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Mụta maka nri na-edozi ụbụrụisi ka enye kwa gị ogologo ndụ na ahụisiike.

Ị ma nri asaa nwere ike ịnyere gị aka ịchu nsogbu ụbụrụisi ọsọ ụkwụ eru ala?

Mmadụ ijeri iri na ise n'ụwa nile gburugburu na aria ọria nsogbu ubụruisi nke na-ebute oke nchefu na nsogbu ọmụmụ ihe, tinyekwara ihe ruru mmadu ijeri iri na enweta oria a kwa afọ (WHO).

N'agbanyehi na a chọpụtala na erimeri sonyere n'ihe na-edozi ubụrụisi, mana enweghi ọmụmụ ihe ama na akwado ya.

Mmanya "Red Wine", Kọfịị, na Chọkọlet nakwa mmanya "Champagne" ewuola ewu dịka nri ebube maka ihe gbasara nsogbu ụbụrụisi.

Mana, enwere eziokwu dị n'okwu ndị a?

Ngwa gụọ ihe Sheila Dillon bụ onye ọrụ BBC chọpụtara mgbe ọ gbara ndị ọkammụta ajụjụ ọnụ maka n'ihe gbasatara okwu a .

Dịka ị ga-achọputa, nri ndị a na-enyere aka maka ọdịmma ụbụrụisi gị:

1. Nri sitere n'mmiri

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ezigbote protein, gbara obere abuba ma juputakwa na 'Omega Fatty Acids' .

Iri nri azụ juputara na ya otu mgbe maọbụ karia n'izuka na-enyere ụbụrụisi aka nke ukwu.

2. Mkpụrụ osisi "vine" na mkpụrụ ndị ọzọ yiri ya.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Were Mkpụrụ osisi vine leta Ụbụrụisi n'ahụ gị mma

Mkpụrụ osisi dị ka "Strawberries" na "blueberries" nwere ihe na-egbochi mbido nsogbo ọmụmụ nke ụbụrụisi.

3. Ọpupa na ak diche iche

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Aki na mkpuru di iche iche n'enye ahu-ike ma na edozi kwa ụbụrụisi

Onye n'eri nani 30mg nke akị dị iche iche, ọka,"rye", osikapa nke n'acha ncharanchara, ọka milet, ọka "oats" ma na-eri kwa "protein", "minerlas" na kwa "fibre" ka ahụta na nsobgu ụbụrụisi ga agbara ya ọsọ.

4. Ụgụ

Nkenke aha onyonyo Ụgụ na-enye ọbara ma na edozi kwa ụbụrụisi

Ọnye kwuru na ụgụ na akwụkwọ nri ndị ozo na-edozi ụbụrụisi, onye ahụ mara ihe ọ na-ekwu.

5. Vịtamịn B

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Vịtamịn B : e ji la ya gwuo egwu

Mkpụrụ mmadụ ole nwere ọbele nsogbu ụbụrụ isi enyere Vịtamịn B kosiri ezigbote mgbake nke ụbụrụisi.

6. I na aṅu kwa ihe ọṅuṅụ mmiri koko?

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ka anyi kelee ndi gboo nke "Olmec-Mexico" maka i gosi ụwa niile ihe ọṅụṅụ mmiri koko.

Koko na-adị mma maka akwara-ozi ma na-edozi kwa mkpụrụ-ndụ.

Mana cheta kwa ka i na-aṅu mmiri koko nke nwere ọbere shuga.

7. Ubebekee

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo I nwere ike inweta Ubebekee uwa nile gburugburu

Ihe sonyere mee ka ube Bekee na-ewu ewu n'ụwa niile bụ maka na ọ na-enyere aka maka ọ dị mma ụbụrụisi.

Ugbua odoola gị anya?

Nri ndị a niile araghị ahụ ị nweta ma enwe kwara ndị ọzọ enwereike iji gbanwe nke ị na-achọtaghi n'ogbe gị.

Ma cheta kwa, nri ndị a abụghị nani maka ụbụrụisi gị, ha na-edozi ahụ gị were mee ka ị kwụrụ chịm!

Edemede a bụ mgbanwe edemede "Diet and Dementia", nke pụrụiche nke ndị "BBC's The Food Programme" .