Abia Teachers Strike: Ndị nkuzi Abia Steeti ha ka nọ n'abụbụọrụ?

Ụmụakwụkwọ na-akuzi onwe ha Image copyright AFP

Ndị nkuzi ụlọakwụkwọ Praịmarị na Sekọndịrị nke Abia Steeti gbara abụbụọrụ n'ihi akwụghị ụgwọ ọnwa.

Ndị nkuzi praịmarị sị ka akwụghị ha ụgwọ a kpọrọ 'Teacher Salary Subsidy' ebe ndị nke sekọndịrị na-achọ ụgwọ ọnwa iri e ji ha n'ụgwọ.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionGovernorship election: Anyị akwụchala ndị ọrụ ụgwọ ha - Ikpeazu

Akụkọ kwuru na ndị nkuzi a na gọọmentị nwere mkparịta ụka n'izuụka a bụ mgbe a rịọrọ ha kagbuo abụbụọrụ ahụ.

Mana n'ụbọchị Monde bụ abalị atọ nke ọnwa Juun, ndị nkuzi agaghị ụlọakwụkwọ.

Onyeisi otu jikọtara ndị ọrụ n'Abia Steeti bụ Uchenna Obigwe kọwaara BBC Igbo mpụtara mkparịta ụka ha na gọọmentị Abia State.

Image copyright Uchenna Obigwe/Facebook
Nkenke aha onyonyo Onyeisi otu jikọtara ndị ọrụ n'Abia Steeti bụ Uchenna Obigwe

O kwuru na gọọmentị kwetere na ha mere ihe ọjọọ site n'iji ndị nkuzi ụgwọ rue ọnwa iri ma kwee nkwa iji nwaayọọ kwụcha ụgwọ ndị a.

Ọ sị na gọọmentị wepụtara ego dị otu ijeri na ọma ise iji kwụọ ndị nkuzi ụgwọ ọnwa Ọgọstụ, Seputemba na Nọvemba afọ 2018.

Obigwe kwuru na gọomentị sị na ha ga na-akwụ ụgwọ ọnwa abụọ n'ime otu ọnwa nke ga-amalite na ngwụcha ọnwa Juun iji kwụchapụ ụgwọ ndị fọrọ afọ.

Obigwe sị na ọ bụ nkwekọrịta a ka gọọmentị na ndị nkuzi nwere rue ugbua, na onweghi mgbe ndị nkuzi ji sị na ha ekweghi.

Ọ rụtụrụ aka na ihe nwereike ime ka ọ dị ka ndị nkuzi ebidobeghi ọrụ bụ na ndị isi ha ezibeghi ha ozi banyere nkwerikọta a.

Ka ọ dị ugbua, ụlọ akwụkwọ ka gbachichara agbachi n'Abịa steeti, dịka onye nkuzi BBC Igbo gbara ajụjụ ọnụ sị na ha enwetebeghị ozi ka na lagachi ọrụ.

Onye bụbụ Kọmisọna mgbasa ozi na steeti ahụ bu John Okeiyi gwara BBC Igbo na ya amaghị nke na-eme na gọọmentị ugbua dịka ya anọghịzị n'ọkwa.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: