AIT shutdown: Ụlọikpe ukwu n'Abụja emepeela AIT ọzọ

Akụkọ dịmkpa n'ụtụtụ a

Ụlọikpe enyela AIT ikike ịmalite ọrụ

Image copyright @AIT_Online

Ọzọ ụlọikpe ukwu nọ n'Abụja enyekwala iwu ka NBC tọhapụ mmachi ha machiri ụlọntaakụkọ AIT na Raypower ụbọchị Fraide ganye na e bie ikpe ya.

Nke a na-eme dị ka otu ndị ntaakụkọ bụ NUJ,NGE nakwa Media Right Agenda na ndị ọzọ katọrọ ya bụ mmechi e mechiri ụlọọrụ ntaakụkọ ahụ.

Mana onyeisi otu NUJ bu Christopher Isinguzo gwara BBC Igbo na mmachi a machiri AIT na Raypower megidere iwu nnwereonwe nke ndị ntaakụkọ nke Bekee kpọrọ, 'Press Freedom'.

Isinguzo kwuru na ọbụrụgodu na ụlọọrụ ntaakụkọ ahụ dara iwu dika NBC si bo ha n'ebubo, ọ dị ọtụtụ ụzọ e nwere ike isi taa ha ahụhụ karịa ị napụ ha ikike ha ji arụ ọrụ ma ọbụ mechie ụlọọrụ ha. Otu n'me ụzọ ndia gụnyere ime ka ha kwụọ nnukwu ụgwọ.

Onyeisi otu NUJ ahụ kwukwara na ọ ga-amagbu onwe ya ma NBC nyeghachi AIT na Raypower ikikere mgbasaozi ha ma werezie nwayọọ chọwa otu ha ga-esi taa ụlọọrụ ahụ ahụhụ ma ọbụrụ na ha dara iwu n'ezie.

Ụlọikpe enyela Inec iwu maka asambodo Rochas

ROCHAS OKOROCHA Image copyright @REA;ROCHAS/TWITTER

Ụlọikpe ukwu n'Abụja enyela iwu ka Inec nye Rochas Okorocha asambodo dịka onye meriri ọkwa ịnọchite Imo West n'ụlọomeiwu Ukwu na ntuliaka emere n'ọnwa Febuwari. iri abụọ na atọ, afọ a.

May emeela ike ya

Theresa May Image copyright Getty Images

Praim Minista mba Briten bụ Theresa May achịsala ọwa taa bụ Fraide dịka onye ndu ndị patị ha.

May bụ onye ga-achịgịde mba ahụ rụọ mgbe onye ọchịchị ọzọ pụtara sị na ọ dị ya mwute na ya enweghị ike ime ka Briten sị na EU pụọ.

Nadal meriri Rogers

Nadal meriri Rogers Image copyright Rex Features

N'egwuruegwu, Rafael Nadal etụrụla ugo mmeri na tenis ya na Roger Federer pịara taa n'asompi French Open.

Onye meriri n'etiti Djokovic na Dominic ga-ezute Nadal n'agba nke ọkaibe bụ e kwucha ọ gwụ. Mmiri ozizo emeela ka akwụsị ya bụ egwuregwu Djokovic na Dominic ka ọ dị ugbua.

Nkeji Igbo

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe niile

Ogbunigwe egbuola mmadụ atọ n'Oguta dị na Imo steeti

Obodo Konduga Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ogbunigwe so na ihe ndị Boko Haram jị ebuso Naịjirịa agha

Ihe anya mmiri mere n'Oguta dị n'Imo steeti mgbe mmadụ atọ lara mụọ n'ike site n'ogbunigwe amabeghị ka o si gbaa.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Orlando Ikeokwu gwara ndị ntaakukọ na ndị ọdachị a metụtara bụ ndị na-ere akpakara igwe.

Ọ sị na ha amaghị na ogbunigwe so n'ime akpakara igwe ha na-akụgwọ bụ nke gbara ma gbuo ha.

Ikeokwu kpọrọ aha ndị a nwụrụ dịka Elvis Ukado, Kasiemobi Uzoma na Justice Adie.

Ndị uweojii sị ka ndị mmadụ gbaa ama ma ha hụ ihe ọbụla yiri ogbunigwe.

Ọtụtụ ogbunigwe site mgbe alụrụ agha Biafra ka dị n'ala Igbo.

N'afọ 2012, ogbunigwe eji lụọ agha gbara n'ahịa Oye di n'Awgu dịka a na-agba ahịhịa ọkụ.

Anapụla AIT ikike ịgbasa ozi

Image copyright @AIT_Online

National Broadcasting Corporation (NBC) ewezugara ikike ọrụ ụlo ntaakụkọ AIT ụnyaahụ maka ebubo na ha adịghị erube isi n'iwu ji mgbasa ozi na Naịjirịa.

Ugbua, AIT na ogbo ha bụ Raypower anaghịzị agbasa ozi.

Amabeghị mgbe ha ga-asị ha bidokwa ọzọ

N'Ofesi,

Image copyright Reuters

Ụlọ ọrọ na-amịpụta mmanụ agbịdị si Norway bụ Equinor ekwuola na ọgbọ miri kụrụ ogige ha sị amịpụta mmanụ n'ime oshimiri.

Ha kwuru na ha mere ngwa ngwa bupu mmadụ narị abụọ na irir asaa na isii nọ ọrụ ebe ahụ.

Onweghị onye nụrụ maọbụ merụọ ahụ

N'egwuregwu

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ndị egwuregwu Frans

Iko Mba Ụwa nke ụmụnwaanyị ga-amalite taa.

France ga-ezute Sawụt Koria iji si ngwanụ na ya bụ asọmụ mpị. Naịjirịa na Norway bụ echi, dịka Spen na Sawụt Afịrịka ga-ezute kwa echi ahụ.

Gee nkeji ndị a ebe a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe niile

Ihe nkiri nke taata:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNwaanyị lụtara nwa ya nwụrụ nwaanyị