Naira Marley: Ihe mere oti egwu a ka ji nọrọ na mkpọrọ

Naira Marley on May 20 for Image copyright Economic and Financial Crimes Commission

Onye oti egwu Naira Marley nke ezigbo aha ya bụ Afeez Eniola ka nọkwa mkpọrọ agbanyeghị na ụlọikpe nke ukwu dị na Legọs nyere ya ohere ka o si ụlọ na-abịa ikpe ya.

Ọkaikpe Nicholas Oweibo ji nde naira abụọ na mmadụ abụọ nye Naira Marley akambee ka o sị n'ụlọ bịawa ikpe n'ụbọchị iri atọ nke ọnwa Mee.

Oweibo si na ndị ahụ ga-enye ya akambee ahụ ga-abụrịrị ndị ọrụ gọọmentị ọkwa ha ruru ogogo iri, nwekwa ala n'ebe ụlọikpe ga-akwado.

Cheta na ngalaba na-ahụ maka nrụrụaka bụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) kpụpụrụ Naira Marley ụlọikpe maka ebubo na aka ya dị na nrụrụ aka na mpụ.

EFCC sị na akwụkwọ "credit card" ahụrụ na be Naira Marley nwere aha "Nicole Louise Malyon na Timea Fedorne Tatar, bụ ndị amabeghi ndị ha bụ.

Naira Marley gọrọ na onweghi ihe omere dịka EFCC na-ekwu na mpụ ha boro ya megidere iwu akpọrọ "Money Laundering (Prohibition) Act and the Cyber Crimes Act".

Mana ugbua, ọ ka nọ na mkpọrọ maka onweghị onye ga-agbapụta ya.

Nsogbu Naira Marley malitere mgbe odere maka ndị na-eme mpụ akpọrọ Yahoo Yahoo na Twitter na-asị na-ekwesighi ịma ha ikpe maka ihe ha na-eme.

Mkpebi ya bụ na ndị ofesi were ihe ndị isi ojii la be ha mgbe ochie, ya bụ na ọ bụ ihe a ka ndị Yahoo Yahoo na anatagharị.

Okwu nwuru ọkụ na soshal midia nke mere onye oti egwu ọzọ ama ama bụ Rugged Man jiri katọ ya.