Rochas Okorocha: Aka Chibụrụ Imo steeti aṅụọla iyi ọrụ dịka Onyeomeiwu Naịjirịa

Rochas Okorocha Image copyright FCC Jones

N'ụtụtụ taa bụ abali iri na ato nke ọnwa Juun 2019 onyeisi ụlọomeiwu ukwu bụ Ahmed Lawan duru Okorocha n'iyi ọrụ mee ka o zuo oke dika onye omeiwu .

Nke a na-abịa dịka ngalaba na-ahu maka ntuliaka na Naịjirịa bụ Inec nyere Okorocha asambodo gosiri na ọ bu ya meriri ntuliaka eji họpụta onye ga-anọchịte anya mpaghara Imo West na Ụlọomeiwu Ukwu.

Okorocha esoghi ndị omeiwu ibe ya ṅụọ iyi ọrụ n'abalị abụọ gara aga bu ụbọchi nke iri na otu nke ọnwa Mee n'ihi na mgbe ahụ INEC enyebeghi ya asambodo dika onye tuuru ugo na ntuliaka eme n'Imo West.

INEC mechara nye Okorocha asambodo ahụ mgbe ụlọikpe ukwu dị n'Abuja nyere ha iwu ka ha mee otu ahụ.

Ọ fodụzịrị nani mpaghara Imo North ka ndị omeiwu ukwu si Steeti Imo zuo oke. Ntuliaka e mere iji họpụta onye ga-anọchi anya Imo North agachaghị nke oma, nke ahụ mere ka INEC yigharia ya bụ ntuliaka.

Ma tupu eyighaa ya, Ndubueze Patrick, nke otu ndọrọndọrọ ọchịchị Peoples Democratic Party (PDP) ji vootu olemole akari nke onye ogbo ya bụ Benjamin Uwajumogu onye otu ndọrọndọrọ ọchịchị All Progressives Congress (APC).

Okorocha bụ aka chịbụrụ Imo steeti ka rituru n'ọkwa ọhụrụ a.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionRochas Okorocha

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a