Unmarried women: Nwaanyị alụghị di ọ ka ogbo ya lụrụ di enwe aṅụrị?

Ụmụnwaanyị Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Kedụ onye ka enwe aṅụrị: Nwaanyị alụghị di ka ọ bụ nwaanyị nọ na di

Otu ọkammụta a kpọrọ Paul Dolan kwuru na nchọpụta ha mere na nsonso na-egosi na ụmụnwaanyị alụghị di kachasị enwe anụrị n'ime mmadu niile.

O kwuru na ihe akaebe na-egosi na nwekwara ike ibi ogologo ndụ karịa ogbo ha ndị lụụ di ma mụta ụmụ.

Dolan onye bụ ọkammụta na Sayensi agwammadụ na London School of Economics alụmdi na-aka a bara ụmụnwoke n'ihi na ọ na-eme ka "isi jụọ ha oyi."

"Ha na-akwụsị ịkpa aghara nwere ike ibutere ha nsogbu, ma bido tinye uchu n'ọrụ ha iji kpata ego."

"Mana nwaanyị, ga na-edi ọtụtụ ihe, o nwere ike nwụọ ọsịsọ karịa ndị ọgbọ ya alụbeghị di."

Dolan onye gbakwasara ụkwụ na nchọpụta 'the American Time Use Survey' gara n'ihu kwuo na ndị kachasị nwee ahụike ma ka na-enwe aṅụrị bụ ụmụnwaanyị ndị na-alụghị di maọbụ mụta nwa."

Ihe ụmụ nwaanyị Naijiria na-ekwu maka ya

Mana ụmụnwaanyị ndị Naijria kwuru na ọ bụghị ka akụ ilu sị ada ka o si atọọ. Ha kwuru na ka ọnọdụ onye sị dị ga-ekwu ma ọ ga na-enwe aṅụrị na ọ bụghị alụmdi maọbụ alụghị alụ.

Omagha Grace, alụbeghị di

Image copyright Omagha Grace

Ọ gbara ama na o nwere oge owu ọmụma na-eji onye alubeghị di, nke nwere ike ime ya obi adịghị mma. Mana n'uche ya, "ọ bụrụ na ị lụbeghị di mana ị mara ebe ị na-aga, ị ga na-enwe aṅ ri."

"Ị ga-enwe ohere ime ihe ị chọrọ ime na enweghị mkpachi."

"Ọ bụrụ na ịlụ onye hụrụ gị n'anya ma na-akwado ihe ị na-eme, ị ga-enwe aṅụrị."

"Aṅụrị abụghị ihe ịlụ di maọbụ alụghị di na-eweta."

Chidinma Njoku alụọla di mụta ụmụ

Image copyright Chidinma Njoku

Chidinma Njoku kwuru na o nweghị onye ka ibe ya enwe aṅụrị n'etiti onye lụụ di na onye alụbeghị n'ihi na dịka o siri kọwaa, ihe niile nwere oge.

" Mgbe m alụbeghị di, mgbe sọrọ m arahụ m, mgbe sọrọ m aga m pati."

" Mana ugbua, mgbe ị chọrọ ịrahụ ụra ga-abụ oge ị ga-eji achụgharị nwaa ka ọ bịa saa ahụ maọbụ rie nri."

" Ọ bụghị ma ị lụrụ di maọbụ na ịlụghị di. Onye nụtara ezigbo di ga na-enwe aṅụrị. "

Dkta Chioma Ofoekii alụbeghị di

Image copyright Chioma

Chioma kwuru na ihe mere o jiri dịka nwaanyị anọghị na di ka nke nọ na ndị enwe anwụrị bụ na ọtụtụ ụmụnwoke n'ala Igbo anaghị ekwe enyere nwụnye aka n'ụlọ.

"Onye alụghị di nwere ike kwuo ihe ọ chọrọ ịrụ ma ruro ya n'isi , o nweghị onye ọ ga-anata ikike ịchụ ebumnobi ya."

"Nwaanyị lụọ di, ọrụ isi nri, ịsụ akwa ma nke ya ma nke dị ya na-enwere oge ya."

"O nweghị onye ga-enyere ya aka n'ihi na Ndigbo na-ahụ nwoke inyere nwunye ya aka dika ihe ọjọọ. Ha na-eme nwunye ha ka ha abụ ohu."

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: