Palm-oil importation ban: Buhari enyela Ụlọakụ Etiti iwu ịmachie ịtụbata mmanụ nri

Akụkọ ndị dị mkpa taa:

Buhari enyela Ụlọakụ Etiti iwu ịmachie ịtụbata mmanụ nri

Image copyright Getty Images

Onyeisiala Naijiria Mohammadu Buhari enyela ụlọakụ etiti bụ Central Bank ntuziaka ka ha machie ulooru obula itubata mmanu nri na Naijiria.

Buhari onye kwuru nke oge ya na ndị na-emepụta mmanụ nri nwere ọgbakọ n'Abuja ụbọchị Fraide sị na " ndị ọrụụgbọ enweghịzị ọrụ n'ihi na anyị si mba dị icheiche atụbata mmanụ nri."

O kwuru na ime nke a ga-akwalite imepụta mmadụ nri ebe ọ dị ukwuu n'ala Naijiria.

Ụlọikpe kachasị atọpụla Senetọ David Umaru ọgọdọ n'ama

Senator David Umaru Image copyright Senator David Umaru Foundation/Facebook

Ụlọikpe kachasị na Naijiria achụdala Senatọ David Umaru nke APC bụ onye na-anochite mpaghara Niger-East n'Ụlọomeiwu Ukwu ma nye Mohammed Sani Musa ọkwa ahụ.

Umaru sobu na ndị sinatọ ọhụrụ e duru n'iyi ọrụ ụbọchị Monday mana ugbua ụgbọ aghala ya.

Na mkpebi ha, ndị okaikpe ise nke Jọstis Ibrahim Muhammad nọ n'isi ya nyere, ha kwuru na Umaru abụghị onye pati ya bụ APC họpụtara n'ụzọ ziri ezi kama na ọ bụ Mohammed Sani Musa meriri na ntuliaka imeụlọ pati ha mere..

Jọstis Muhammad gara n'ihu nye Inec iwu ka ha mee ngwangwa nye Mohammed Sani Musa asambodo mmeri.

Mohammed Sani Musa Image copyright Mohammed Sani Musa

Cheta n'ụlọikpe ukwu nọ n' Abuja kpebiburu na ọ bụ Sani bụ onye meriri na ntuliaka imeụlọ pati ha mere mana mkpebi ahụ adịghị Umaru mma.

Umaru gbagharịa akwụkwọ n'Ụlọikpe Mkpeharị ebe e nyere ya mmeri man ugbu, Ụlọikpe Kachasị atọpula ya ọgọdọo n'ama abali ole na ole e duchara ya iyiọrụ dịka Senetọ.

Ọzọdimgba ọ na-ezuzị egọ?

Ọzọdimgba Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ọzọdimgba ana-ebuzi ego?

Ndị uweojii na-ekwu na ha na-enyocha ihe mere ego ruru nde naira asaa bụ ego na-efu efu n' ogige ụmụanụmanụ, Kano Zoological Gardens, nke ndị ọrụ sị nọ bụ ọzọdịmgba buru gbalaga ma loo ya..

Na ofesi,

Onyeisiala mba America bụ Donald Trump ebola mba Iran ebubo na o bu ha gara na ụgbọmmanụ agbidi abuo di na Gulf were mebie nnukwu ihe ebe ndi iran na- agoro ukwu na aka ha na ha amaghi maka ya.

WWC: Japan agbaala Scotland 2:1

Otu boolu umunwaanyi Japan na Scotland Image copyright Getty Images

N'egwuregwu, ndi otu boolu umunwaanyi Japan agbaala ndi ogbo ha si mba Scotland okpu abuo asatara otu n'Iko mba uwa na_aga n'ihu.

Ka ọ dị ugbua Japan jizi mmeri a nọro n'isi otu D.

Gee akụkọ ndị a ebe:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla

O nweghi ihe dịka Onyeisiala bụ onye Igbo - Okorocha

Rochas Okorocha

Aka chịbụrụ Imo steeti bụ Rochas Okorocha etinyela ọnụ n'okwu ịhọpụta onyeisiala bụ onye Igbo dịka olilanya ndị mmadụ dịzị na ntulika nke 2023 ka ọ sị na nke ahụ abụghị isi okwu.

Sinetọ Okorocha kwuru okwu ụnyaahụ bụ ụbọchị nke iri atọ nke ọnwa Juun ka ya na ndị ntaakụkọ na-eme mkparịtaụka n'azụ ka educhara ya n'iyi ọrụ.

N'okwu Okorocha, ọ sị na ọka mkpa na onwe wwetere ọchịchị dịka onyeisiala bụ onye ga-abara Naịjirịa uru, ma onye ahụ abụ onye Igbo, ma ọ bụghi onye Igbo.

Okorocha sị: "Ekwesighi ị na-ekwu maka Onyeisiala ga-abụ onye Igbo makana onweghi ihe dịka ya. Ihe dị bụ Onyeisisala Naịjirịa nwereike bụrụ onye Igbo."

N'okwu inweta onye Igbo ga-apụta dịka onyeisiala n'afọ 2023, ọ sị na ọ bụ ihe Igbo agaghị emenwu sọsọ ha.

"Ndị Igbo na ndị mpaghara Naịjirịa ndị ọzọ ga-enwe ekwekọrịta ka eme ka nke a pụta ihe."

Inec sị na ha enweghị Sava

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ejighị 'Incident Form' ga-akwụsị nrụrụaka na-aga na ntuliaka

Ndị Inec ekwuola na ha onweghị igwe kọmpụta sava ha nwere na ntuliaka emere na ọnwa Febuwari.

Chete na Atiku na PDP gbara Inec akwụkwọ n'ulọikpe na-arịọ ka e gosi ha ihe dị na ya bụ sava bụ ebe ha sị na ekpokọtara mpụtara ntuliaka niile.

US na Iran

Image copyright FREDERICK A TERRY/ARTJOM LOFITSKI

N'ofesi e, mba Amerịka wepụtela ihe onyonyo ha sị gbara akaebe na ọ bụ Iran gbara ogbunigwe na ụgbọmmiri bu mmanụ agbidi aga Japan.

Mba Iran agọọla na aka ha adịghị na ya bụ ogbunigwe gbaran'ime oshimiri dị nso na mba.

Juventus egola Maurizio Sarri

Image copyright PA
Nkenke aha onyonyo Maurizio Sarri

N'egwuruegwu, Chelsea ekwetala ka onye nchikọta ha bụ Maurizio Sarri gawazịa Juventus.

Juventus ga- akwụ ha ihe ruru nde pound ise maka nke a.

Akụkọ ga-amasị gị