Inec Server: 'Anyị achịkọtala ọnụọgụgụ 'card reader' niile otu ebe na kọmputa'

Festus Okoye na Emeka Unachukwu

Onyeozi Inec bụ Festus Okoye ka an-ekwusi ike na ndị ụlọọrụ ahụ enweghị "Server" bụ nke nyere ha ohere izipụ mpụtara ntuliaka 2019.

Okoye si na iwu Naịjirịa enyeghị ha ohere ime otu ahụ.

N'olu ya, "iwu Naịjrịa nyere ikike iburu mpụtara ntuliaka niile nke dị na "fọm̀ EC8A" n'aka buga ebe a ga-egbokọba ha na wọdụ."

"Iwu Naịjirịa anyị ji mee ya bụ ntuliaka amaghị iji igwe kọmpụta zipu ozi ọbụla."

Ndị 'Collation Officer' ka ọ bụ ọrụ ha iburu akwụkwọ ndị a n'aka buga ebe a chọrọ ya.

"O nweghị mgbe anyị jiri igwe kọmpụta zipụ mpụtara ntuliaka."

Okoye kwetara na ndị debere aha ha n'akwụkwọ maka ntuliaka 2019 niile dị na igwe kọmputa, na enyere ndị otu pati niile aha ndị a.

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ejighị 'Incident Form' ga-akwụsị nrụrụaka na-aga na ntuliaka

O kwusiri ike na "ọ bụ naanị mgbe eji igwe kọmuta tụọ vootu ka a ga-asi na ihe dị na sava".

Ọ sị na ya amaghị maka mpụtara ntulika 2019 ị dị na sava ọbụla.

N'otu aka ahụ BBC jụkwara onye ọrụ kọmpụta ama ama bụ Emeka Unachukwu gịnị bụ 'server'?

Unachukwu sị na "'Server' bụ kọmpụta na-ejikọ kọmpụta ndị ọzọ ọnụ eji edewe mkpụrụozi dị iche iche".

O kwuru na Inec nwere ike ikwu na ha enweghị 'server' maka na o nwere ụlọọrụ ọzọ na e jidere ha mkpụrụozi mana ọ bụghị eziokwu na ha enweghị server' ebe e nwere mkpụrụozi.

Ọ sị na Intanet nwere 'server' nke ya ebe ọtụtụ mmadụ na-edowe ozi ha.

Unachukwu sị na "Inec agaghị asị na ha enweghị sava maka na ha nwere ebe ha na edowe mkpụrụozi bụ data. Ha nwere ike kpọ nke a "data base" mana ihe ọ bụ bụ sava maka na kọmpụta ahụ jikoro ndị ọzọ ọnụ bụ ndị nke nwere ike ịdọro ọzi maọbụ zite ọzi na ya".

Ọ sị na ọhịara ahụ Inec isi na ha enweghị server'.

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ha na-akpọ ndị mmadụ bịa were PVC ha dịrị njikere maka ntuliaka

Unachukwu kwuru na ọ bụrụgodi na a tụrụ vootu n'aka buru ya n'aka buga ebe a gụrụ ya, na Inec ga-etinyekwa ya na ya bụ 'server'.

Mana ha nwere ike ikwu na ha etinyebeghị mpụtara 2019 na ya bụ 'server' nke gosiri na ha arụchabeghị ọrụ ha.

Akụkọ ga-amasị gị

Lee ihe nkiri anyị

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionGịnị bụ 'democracy' in asụsụ Igbo?

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a