Regina Daniels: Alụọla m di

Regina Daniels Image copyright ReginaDaniels/Instagram

Agha a kara aka anaghị eri ngwụrọ, nwada Igbo na-eme ihe nkiri a ma ama bụ Regina Daniels emezuola nkwa o kwere ịkọrọ ụmụ Naijiria ije ya na Ned Nwoko.

Cheta na Regina onye na-ewu na soshal midia kemgbe ọnwa atọ kwere nkwa ịkụwa akịoyibo Nsugbe.

Image copyright BBCIgbo/ReginaDaniels/Instagram

N'ozi mgbaama dị n'ihe onyonyo o wepụtata na nsonso, ọ kpọrọ okwu aha kpomkwem sị n'ezie na kepukepu ahụ na-ewu banyere alụmdi ya bụ eziokwu.

Image copyright Reginadaniels/Instagram
Nkenke aha onyonyo Regina Daniels

Regina, onye aha Igbo ya bụ, Nneamaka, kwuru sị "Alụọla m di" dịka o wepụtara ọla aka dị ya n'aka tinye na mkpịsịaka nke so ọdụdụaka.

Ọ gara n'ihu zaa ndị na-ekwu na ọ bụ maka ego mere o jiri lụọ onye tọrọ ya mgba n'elu, mgba n'ala sị, "Obi na atọ m ka nnu ugbua n'ihi na ịhụnanay na-egbu m ka mmanya."

Ọ tụpụkwara egbe ntụnala dịka o kwuru na onye ikpeazụ o degara ozi n'ekwe ntị bụ Somadina.

Image copyright Regina Daniels/Instagram

Cheta na dịka akụkọ na ọ lụụ onye ndọrọrọndọọ ọchịchị ama ama bụ Ned Nwoko na-ewu, akụkọ na ọ gbahapụrụ Somadina bụ onye ọtụtụ na-arụ aka na ọ bụ enyi ya nwoke wukwara.

Akụkọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara