Child Trafficking: Ichi egburu nwata a n'ihu zọrọ ya n'aka onye ntọrị

Nwata atọrọ Image copyright Nigerian Police

Ndị uweojii si ngalaba "Special Anti Robbery Squad (SARS) nwụchịrị otu nwaanyi aha ya bụ Queen Imoh ka ọ gara ịrị̄ nwatakịrị n'obodo Umuna nke Orlu, Imo steeti.

Queen Imoh, bụ onye uweojii si na ọ bụ onye mba Kameron, zutere nwata ahụ aha ya bụ Naziru Adbulwahab na mpaghara Nassarawa dị Kaduna, isi obodo Kaduna steeti.

Akwụkwọ ozi sị n'aka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo bụ Godson Ikeokwu sị na ọ bụ ndị mmadụ hụrụ Imoh na nwata ahụ wee che na ọgaghị abụ nne ya gbaara ndị uweojii ama.

Image copyright Nigerian Police
Nkenke aha onyonyo Ndị uweojii sị na nna nwata ahụ atọrọ a bịala kpọrọ ya

Ndị uweojii sị na Imoh kwenyere na ya zutere nwata ahụ aha ya bụ Naziru Abdulwahab ma kwukwa na ọbụghị mbụ ya kpara ụdịrị ike a.

Dịka ndị uweojii siri dee, Imoh gwara ha na ya rere nwa ya aha ya bụ Joseph Imoh dị afọ abụọ pụtụ naịra narị abụọ.

Image copyright Nigerian Police
Nkenke aha onyonyo Ndị uweojii sị na Queen Imoh kwere na ya mere ihe a sị na o mere

Ọ sịkwa na ya rere nwata aha ya bụ Samuel M dị otu afọ puku naira narị abụọ na iri atọ. Ọ sị na ya zuru nwata nke a mgbe nne ya si ya nedo ya anya.

Godson Ikeokwu dere na ọ bụ ndị Awụsa nọ n'Orlu nyere aka chọta nne na nna Naziru ma hụ na o ruru ha aka.

Imoh ka nọ n'aka ndi uweojii.

Ntọrị ụmụaka bụ ihe na-eme kwamgbe na Naịjịrịa, ọkachasị n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa.

Lee ihe nkiri anyị maka ntọrị ụmụaka:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionKidnapping in Nigeria: 'E gburu ndị atọrọ mụ na ha mana Chineke zọrọ m ndụ'

Isiokwu Ndị Emetụtara