Women's World Cup: Super Falcons e jizi otu ụkwụ kwụrụ?

Image copyright Getty Images

Goolu abụọ nke Ajara Nchout nyere na nkeji 95 bu nke bufere Cameroon kpam kpam n'agba nke abụọ asọmpi a.

Nchout bu onye nyere goolu mbu na nkeji 57 nke mba New Zealand satara ha.

Etu asọmpi si metụta Naịjirịa bụ na mba Chile kwesiri imeri mba Thailand tupu Falcons anafere.

Ugbua, ọ bụzị ngụkọ goolu bụ goal aggregate na Bekee ka a ga-eji ma onye meriri.

Igwe mmadụ akụola ndị ohi na-anapụ mmadụ akpa dukaduka n' Enugu

Image copyright Getty Images

Ndị mmadụ ewerela iwe kụọ ndị e chere na ha bụ ndị ohi akpa ike n'okporo ụgbọoloko dị na mpaghara Holy Ghost, Enugwu, ọkwụrụ n'anya ụbọchị Tuuzde.

Ndị a bụ so n'otu ndị e chere na ha ji egbe na ngwaọgụ ndị ọzọ anapụ ndị mmadụ akpa na ihe dị mkpa na akụkụ ahụ.

Dịka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Enugwu bụ Ebere Amaraizu si kọwara BBC Igbo, ọ bụ oge ndị omekome a napụchara otu nwaanyị akpa ya n'ike ka ndị mmadụ zuru ha n' ahụ kụọ ha ihe tinka kụrụ pan.

"Ndị a bụ ndị na abụ ha hụ mmadụ, ha lee anya,lee anya, ha anapụ gị akpa gị."

"Ndị ọrụ anyị nwetara mkpesa na ndị ohi napụrụ nwaanyị agba ya.

Ndị ọrụ anyị yi akwa nkịtị chụwa ha ọsọ, ha agbaba ọhịa mana ndị mmadụ nyere aka chụwa ha jide ha kụọ ha ihe.

"Mgbe ndị uweoji a kpọrọ ka ha bịa nyere aka rutere, ike akwụla otu, e buga ya ụlọọgwụ , ebe dọkịta kwuru na ọ nwụọla."

Amaraizu onye kwuru na ha napụtara ha mma nakwa ihe ndị mmadụ ha zutere, gara n'ihu kwuo na onye nke ha ji aka na-enyere ha aka na nchọpụta.

Odibo egbuola nneya ukwu abali abụọ o bidochara ọrụ

Image copyright Getty Images

Otu nwaodibo aha ya bụ Joseph Ogbu ewerela mma sugbuo nne ya ukwu nakwa nne nne ya ukwu n'ụbọchị Tọọzde.

Nke a mere naanị abalị abụọ e wechara ya n'ọrụ na mpaghara Surulere na steeti Legọs.

Ogbu onye Benue steeti malitere ọrụ n'abalị iri na asatọ nke ọnwa Juun.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti Legos bu Bala Elkana gwara BBC Igbo na ha anwụchiela nwata nwoke ahụ.

Dịka Elakana si kwuo, "Ogbu kwuru na nne ya ukwu kpasuru ya iwe o wee sugbuo ya."

Ọ sịkwara na ọbughị ya gburu nne nne ya ukwu, kama ọ gharịpụrụ nwụọ mgbe ọ hụrụ na nwa ya anwụọla.

Aha nne ya ukwu bu Oreoluwa John, ebe nke nne ya bu Adejoke John.

Ha gbara afọ iri atọ na asatọ na iri asatọ na itoolu n'otu n'otu.

Ndi uweojii kwuru na ha ka na-enyocha ya bu okwu iji matachaa ihe nile merenụ.

Ọzọ,

Mele Kolo Kyari, onyeisi ọhụrụ NNPC Image copyright OTHERS
Nkenke aha onyonyo Mele Kolo Kyari, onyeisi ọhụrụ NNPC

Gọọmentị Naịjirịa agbaghala okwu na-efegharị na onyeisi NNPC ọhụrụ bụ Mele Kyari so n'ezinaụlọ Abba Kyari.

Cheta na ọ bụ taa ka gọọmentị Naịjirịa kpọpụtara aha Mele Kyari dịka onyeisi ọhụrụ ngalaba na-elekọta mmanụ ụgbọala Naịjirịa bụ NNPC.

N'ofesi,

Ndị Malawi na-eme ngaghrịiwe Image copyright AFP

Puku mmadụ ole na ole abanyela okporoụzọ ime ngagharịiwe na mba Malawi maka mpụtara ntuliaka e mere n'ọnwa gara aga.

Ha na-akpọ oku ka onyeisi ngalaba ntuliaka na mba ha ritue n'ọkwa.

N'egwuregwu,

Aka na-achịkọta otu Super Eagles bụ Gernot Rohr ekwuola na o kwenyesiri ike na otu ya ga-ebulata iko mba Afrịka n'ihi na e nwere ndị ọgba bọọlụ ochie ụkwụ kara aka nakwa ndị ọhụrụ.

Gee nkeji ebe a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Mele Kolo Kyari, onyeisi ọhụrụ NNPC Image copyright OTHERS
Nkenke aha onyonyo Mele Kolo Kyari, onyeisi ọhụrụ NNPC

Onyeisiala Muhammadu Buhari enwepụtala Mele Kyari dịka onyeisi NNPC.

Kyari ga-amalite ọrụ ya n'abali asaa nke ọnwa Julai.

Maikanti Baru bụ onye ji ya bụ ọkwa kemgbe 2016 ga-ala ezumike nka.

Kyari na-anochite anya Naịjirịa na Organisation of Petroleum Exporting Countries (OPEC).

Ọ gụrụ ihe banyere ala, nke Bekee kpọrọ "Geology" na mahadum ma nọrọ isi OPEC economic commission board.

Akwụkwọ na-akọwa na-ọbụghị nwanne Abba Kyari - bụ onye aka nri Onyeisiala Muhammadu Buhari - agbanyeghị na ha na-aza otu aha nna.

Aka ndị uweojii akpara onye ntọ

Image copyright NP Imo state

Gọmenti etiti ekwuola na eziokwụ atọgbọghị na kepukepu na-efegharị na ọrịa Ebola abatala na Naịjirịa ọzọ.

Onye kwuru nke a bụ odeakwụkwọ ukwu ụlọọrụ na ahụ maka ahụike bụ Abdullaziz Abdullahi bụ onye sị na kemgbe 2012 na ọnwebeghị onye ahụrụ bụ ya bụ nje na Naịjirịa.

Agha Ebola

Image copyright Getty Images

Gọmenti etiti ekwuola na eziokwụ atọgbọghị na kepukepu na-efegharị na ọrịa Ebola abatala na Naịjirịa ọzọ.

Onye kwuru nke a bụ odeakwụkwọ ukwu ụlọọrụ na ahụ maka ahụike bụ Abdullaziz Abdullahi bụ onye sị na kemgbe 2012 na ọnwebeghị onye ahụrụ bụ ya bụ nje na Naịjirịa.

Image copyright US NAVY/KELLY SCHINDLER

N'ofesi,

Ndị agha Iran ekwuola na ha gbatụrụ drone mba US ji enyopu ihe na-eme na Iran. Mana ndị US ekwubeghị ka nke a bụ eziokwu ka ọ bụ eziasị.

Iko Aiteo Federation Cup

Image copyright Rangers /Twitter

N'asọmpi agbara ụnyaahụ, otu egwuregwu bọọlụ Smart City nke Legọs ji ọkpụ gọọlụ atọ asatara abụọ chụpụ Enyimba nke Aba na Iko Aiteo Federation Cup.

Rivers United ji ọkpụ atọ chụpụ Akwa united.

Rangers na Nassarawa United sokwa na ndị akupụrụ na ya bụ iko Aiteo

Gee nkeji anyị ebe a

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Akụkọ ga-amasị gị

Isiokwu Ndị Emetụtara