Tory Leadership: Ọ fọziri Jeremy Hunt na Boris Johnson

Jeremy Hunt na Boris Johnson

Nke ọhụrụ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na ọ ofọziri sọsọ Jeremy Hunt na Boris Johnson n'ọsọ ịchị mba Briten.

Nke a pụtara ihe dika Jeremy Hunt ji vootu abụọ merie Michael Gove nwetara vootu 75 n'ụlọomeiwu Briten.

Ọ pụtara na ya na Boris Johnson ga-akwata ya iji maata onye ga-achịrị ọwa Theresa May wụsara.

Image copyright AFP

Cheta na ndị otu kọnzavetive pati na Briten kwadoro ịhọpụta mmadụ abụọ ịnọchị anya Theresa May.

Naanị mmadị atọ ka achọrọ n'ime mmadụ anọ pụtara na ya bụ ndọrọndọrọ bụ nke a ga-eji akpati nzuzo mee.

A na-atụ anya na ụwa ga-ama mpụtara ya bụ ntulika n'elekere nke mbụ taa.

Ka nke a mechere, a ga-eme ntuliaka ọzọ iji hotụpata mmadụ abụọ, nke otu n'ime ha ga-abụzị Praịm Minista Briten.

Onye vootu ya kachasi na nke emere mee bụ Boris Johnson bụ onye ji vote 143 merie Jeremy Hunt, Michael Gover na Sajid Javid.

A kụpụrụ Rory Stewart bụ odeakwụkwọ maka mmepe obodo ndị mba ọzọ maka na onwetere naanị vootu 27.

Ya bụ ọgụ ka dị mma Boris Johnson ebe ọ na-ejikere ị ga ya bụ ọgụ ntụkpọ osisi nke ndị pati ha ruru 160,000 ga-atụrụ ha vootu, bụ nke a ga-eji post ọfis ziga izuụka n'abịa.

Mana ọhịara ahụ ịgba afa mpụtara ya bụ ntuliaka ka ọ dị ugbua.

Ya bụ ka anyị dere duu mara ihe ga-eme.

Akụkọ ga-amas gi

Isiokwu Ndị Emetụtara