Southwest Governors: 'O zuola bụ na o zuola'

Ndị Gọvanọ ọdịda anyanwụ

Ndị gọvanọ ise nọ na mpaghara ọdịda-anyanwụ ekpebiela na ha ga-awụsa otu pati ha nọ na ya n'akụkụ were chọwa ihe dara mmiri n'okwu nsogbu nchekwa na mpaghara ahụ.

Ndị gọvanọ ise ndị ahụ gụnyere Rotimi Akeredolu(Ondo) ;Gboyega Oyetola(Osun), Babajide Sanwo-Olu(Lagos), Kayode Fayemi(Ekiti), Seyi Makinde(Oyo) nwere mkpebi ahụ n'ọgbakọ nchekwa ha nwere n'Ibadan ụbọchị Tuzde.

Ha kwetara ime nke a dịka ha na-atụ arịrị na iji-egbe-ezu, ntọ na mkpamkpa ndị otu nzuzo karịrị akarị na mpaghara ahụ.

Nzuko na-eso akụkọ ntọ nke na-arị ibe ya elu n'ọdịda anyanwụ nke a na-ebo ndị ọchịehi nakwa mkpamkpa ndị omekome ndị ọzọ.

Nigeria High Commission London: Anyị ga na-eziteziri ụmụ Naijiria bi Britain 'passport' n'ụlọ

Image copyright Nigeria Immigration Service

Ụlọọrụ nnọchiteanya Naijiria na mba Briten ekwuola na bido n'abali 24 nke ọnwa June afọ 2019, ha ga na-ezitere ndị tinyere akwụkwọ maka ịnata akwụkwọ njirimaraonye, a kpọrọ 'Passport' na Bekee, ya bụ akwụkwọ n'ụlọ.

Ụlọọrụ ahụ kwupụtara nke a na webụsait ha, gbaziri ndị o metụtara, ka ha gbaa mbọ na-eweta nvulop a kwụrụla ụgwọ ya oge ọbụla ha bịara maka isere photo maka akwụkwọ ahụ.

Ha dọrọ aka na nti ka ha na-etinye akwụkwọ maka ịnata akwụkwọ ọhụrụ ọbụladi ọnwa isii tupu ikike akwụkwọ ahụ ezuo.

Nke a na-eme izu ole na ole, otu okorobịa a kpọrọ Jeffrey Akpovweta Ewohime kụriri ụgbọala ruru asaa n'ụlọọrụ ahụ n'iwe maka ọ bịara iwere akwụkwọ njirimara ya, e nyeghị ya.

Mana ọnụ na-ekwuru ngalaba na-ahụ maka ọpụpụ na mbata na Naijiria bụ Sunday James gwara BBC na izigara ndị mmadụ akwụkwọ njirimara ha abụghị ihe ọhụrụ.

"Anyị na-emebu ya emebu ka ma na ndị mmadụ anaghị emezu ihe a gwara ha mee iji nweta ya n'ụlọ ha."

"Ihe ndị a bụ: iweta nvulop nke ị kwụrụ ụgwọ a ga-eji zitere gị ozi ma dekwa ebe e kwesịrị izitere gị ya bụ ozi."

Nwoke erefuola nwa mbụ ya dị abali atọ

Image copyright Getty Images

Aka ndị uweojii akparala nwata nwoke aha ya bụ Chukwuma Enemuo onye ji n'ihi akpịrị ego ree nwa mbụ ya ma gwa nwunye ya na nwa ha nwụrụ anwụ.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Anambra State bụ Haruna Mohammed kwuru na nke a mere na Ozubulu.

Mohammed kwuru na Chukwuma gwara nwunye ya na nwa ha nwụrụ anwụ, mana ọ gara ree nwa ahụ nara otu nari puku na iri ise (N150,000).

Chukwuma onye gbara afọ iri abụọ na asaa na otu nwoke a kpọrọ Obi Chidiubem bụ ndị kpara nkata wee ree nwa ahụ.

Onye zụrụ nwa ahụ bụ nwanyị aha ya bụ Aṅulika Okafor, onye Uruokwe, Ozubulu.

Ka ọ dị ugbua, anwuchiela mmadụ atọ nile ahụ tinyere aka na ya bụ arụ ebe ndi uweojii ekughachitekwala nwata ahụ e rere ere.

Super Eagles gbara abụbọọrụ maka ụgwọ ha

Image copyright @CAF_Online

Ndị otu egwu bọọlụ Super Eagles gbara abụbụọrụ nwantịtị oge ụbọchi Tuuze,jụụ ime ọzụzụ maka nkwado asọmpi na-abịa n'ihi a kwụghị ha ụgwọ asọmpị ha gbara agba dịka ha ji otu ọkpụ asataghị ihe merichca ndị Burundi n'asompi AFCOn na-aga n'ihu ugbua.

Ọ bụ mgbe onye ndu ha bụ Mikel Obi,bịara rịọ ha , ka jide obi ha ka ha gbanwere obi ha..

Gee akụkọ BBC na Nkeji ebe a

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Agaghị m egbu oge na nhọpụta ndị mịnịsta - Buhari

Image copyright @Mbuhari

Onyeisiala Buhari ekwusiela ike na ọ gaghị egbu oge n'ihọpụta ndị obi ọchịchị ya nke afọ a dịka a na-atụsi anya ike n'aka ya.

N'ozi sị n'ọnụ onye ndụmọdụ ya na mgbasa ozi bụ Femi Adesina kwuru na Buhari agaghị egbu oge dịka o si mee n'afọ 2015.

N'okwu ya "Oge ole ka ndị Naịjirịa ga-eche tupu onyeisiala ahọpụta ndị obi ọchịchị ya? Ndị Naịjirịa agaghị etinyekwu otu ụbọchị n'iche tupu ha enwe ndị ime obi ọchịchị.

Onyeisiala n'onwe ya ekwuola na usoro a agaghị egbu oge dịka ọ dị n'afọ 2015, n'ihi na ọnọdụ agbanweela."

Unu gbadoo anya maka akụkọ nchekwa ụgha - Osinbajo

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Osote onyeisiala Naịjirịa

Osote onyeisiala Yemi Osinbajo agwala ụmụ Naịjirịa bi n'ofesi ka ha kpachara anya n'akụkọ banyere nchekwa na Naịjirịa si na soshal midia apụta.

Osinbajo onye kwuru nke a mgbe ọ na-aza ajụjụ na New York sị na ụfọdụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-afụnye ọkụ n'akụkọ ntọrị na Naịjira.

CBN adọọla ndị Naịjirịa aka na ntị maka MMM

Image copyright Huw Evans picture agency

Ụlọakụ etiti nke Naịjirịa bụ CBN adọọla ọhanaeze aka na ntị na onye ọbụla tinyere ego ya n'ọbaego ọbụla nke ha akwadoghi ga-ebe nwịị mgbe ego ahụ ga-emi ala.

Ozi ha a na-abịa dịka a na-anụ kepukepu na otu ụlọọrụ weta ego bịa were ego a kpọrọ MMM amịpụtala isi ọzọ

N'egwuregwu

Image copyright Empics

Cheta na asọmpi Iko mbaụwa ụmụanwaanyị ka na-aga n'ihu na Fransị, dịka Sweden nọọrọla anyaahụ were otu ọkpu merie Canada

Ebe USA ji ọkpụ abụọ asatara otu merie Spen iji baa n'agba anọ nke ikpeazụ.

Nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Nkiri

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionA chọrọm ịdị ka Einstein - Ekene Franklin Ezeunala