Sanusi Lamido Sanusi: Akụnaụba Naijiria na-achọ ndakpọ - Emir Sanusi

Emir Sanusi Lamido Sanusi Image copyright Getty Images

Emir nke Kano bụ Sanusi Lamido etiela mkpu maka ọnọdụ akụnaụba Naijiria, were kwuo na ọ na-achọ ndakpọ

Ọ sị na ọ bụ n'ihi ego gọọmenti na-emefu dịka ego mgbakwụnye mmanụ (fuel subsidy) nakwa ọkụ latrik.

Sanusi, rụtụrụ aka na Naijiria na-emefu ihe ruru pasent iri asaa n'ego na-abata n'akpa Naijiria n'ịkwụ ụgwọ e ji eji.

Ma kwuo sị na ịga n'ihu gbakwụnye ihe ruru otu tari naira na ụma (N1.5Trillion) a na-akwụ maka na-agbakwụnye na mmanụ na ọkụ latrik(fuel subsidy) kwa afọ, Naijiria nọ na nnukwu nsogbu.

Sanusi kwuru nke a n'ọgbakọ nkuzi nke onye na-ejide akpaego gọọmenti etiti(Accountant-General) hiwere na Kano ụbọchị Tuzde.

Ọ gara n'ihu dụọ onyeisiala Muhammadu Buhari ọdụ ka o wepụ 'subsidy' na mmanụ agbịdị nakwa ọkụ latrik.

"Ala anyị na-akwado ndakpọ."

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNaijiria bụ mba ọnụma na-eto ndị mmadụ afọ n'ezie - Ọkammụta

"Ihe na-eme bụ na gọọmenti etiti na-akwụ ego mgbakwunye na mmanụ, n'ọkụ latrik, ọnụ eji ebi ego gbalite, gọọmenti akwụkwa ya."

"Ihe kacha njọ bụ na anyị gbaghara itinye ego na agụmakwụkwọ, ọnọdụ ahụike nakwa ihe mmepe obodo na-achụ ịnweta mmanụ ụgbọala n'ọnụ ala."

"Ọ bụrụ ezie, na Buhari chọrọ ịchụ ụbịam, ya wepụ nsogbu ihe a ga-ebutere ụlọakụ ga, ya wepụ ego mgbakwunye mmanụ."

Ọ gara n'ihu kpọọ Buhari oku ka ọgwa ụmụ Naijiria n'ezie ọnọdụ akụnaụba Naijiria dị ugbua ma gbaa mbọ gbaa ọsọ mmiri tupu ozobe, n'ihi na "akpa ego Naijiria tọgbọ chakoo ugbua."

Akụkọ ga-amasị gị: