Igbo culture: Uru iri na abụọ ọmụ baara ndị Igbo

Ọmụ
Nkenke aha onyonyo Ọmụ na Ekpe

Igbo sị na a tụọrọ ọmarụ, ọmaru ma atụọrọ ofeke, o tinye isi n'ọhia.

Igbo bụ ndị chukwu ji amamihe were gozie.

Omeenala Igbo dị omimi ma wụrụkwa ihe igbo ji anya isi.

Otu n'ime ihe e jiri mara ndị Igbo bu "ỌMỤ".

Dịka ndị ihe Igbo na-amasị, BBC Igbo kpọrọ onye ọkachamara n'ihe gbasara omenaala Igbo ma bụrụkwa onyeisi ndị otu Ekpe nke Ogbodiukwu dị n'Ụmụọkpara, Abịa steeti, bụ Ọkaiwu Nzenwa Ibe.

Ọ gwara anyị ihe ndị bụ "njirimara" ọmụ nakwa ihe ndị Igbo ji ọmụ eme.

Ihe e ji ọmụ eme

  1. Ebe ọbụla e kere ọmụ maọbụ tinye n'ala na-egosi na a na-azọ ala ahụ azọ.
  2. E ji ọmụ ekechi ihe dị iche iche dịka ụgba, ogiri, nakwa akwụkwọ nri.
  3. Ihe e ji ọmụ kechie n'ala Igbo, anaghị ezu ya ezu; dịka onye kpara nkụ n'ọhịa ga-etinye ọmụ na nkụ ya iji gosi na ọ bụ mmadụ nwe ya.
  4. E jikwa ọmụ egosi ihu arụsị ma na-asị kwa ndị mmadụ abatala ebe ahụ.
  5. E jikwa ọmụ egosi ebe mmanwụ na-esi apụta.
Nkenke aha onyonyo Ọmụ na-egosi ebe mmụọ si apụta

6. Ọmụ e kere n'ukwu osisi na-egosiputa na osisi ahụ dị nsọ n'omenala Igbo.

7. E kee ọmụ n'ụgbọala, ọ na-egosị na ụgbọala ahụ bu ozu.

8. Onye mmadụ bịara nye ọmụ n'aka, dịka ịsị onye ahụ na ya "kpachara anya" n'ebe onye ahụ nọ; ya bụ ịdọ aka na ntị.

9. Ndị otu Ọkọnkọ na-eji ọmụ ekewapụta onwe ha na ndị ọzọ na-abụghị ndị otu ha.

Nkenke aha onyonyo Ọmụ n'egosị ihe dị nsọ n'ala Igbo.

10. N'ebe dị ka Ibeku, Ụmụahịa, n'ala Igbo, igbubi ọmụ na-egosi na e mechaala mmemme ahụ dịka ekpe.

11. N'Ọhafịa, ndị na-agba egwu ikpirikpi ọgụ na-akpụrụ ọmụ n'ọnụ.

Ha agaghị ewepụ ya tupu agbachaa egwu a.

12. N'agba ọhụrụ a, ndị ụka ji ọmụ eme ụkaọmụ bụ Palm Sunday na Bekee.

Ọ bụ ụbọchị ncheta etu Kraist siri banye Jerusalem dịka onye eze.

Nkenke aha onyonyo N'ụka ọmụ n'Ụka Holy Ghost n'Ogui, Enugwu, Ụkọchukwu Ambrose Ofordile kwuru na Izu Ụka Dị Asọ a bụ oge onye otu kraist ọbụla kwesịrị iji nyochaa onwe ya rịọ Chukwu mgbaghara maka njọ
Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIri ji: Ndi ike pụtara n'uju na mgba Igbuzo

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a