Nigeria vs Cameroon: 'Super Eagles' ga-ezute 'Indomitable Lions'

Akụkọ ndị dị mkpa ụbọchị Tuuzde, Julai 2:

Nigeria vs Cameroon Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Eric Maxim Choupo-Moting nke Cameroon na Wilfred Ndidi nke Naijiria

Ndi otu egwu bọọlụ Super Eagles nke Naijiria ga-ezute ndị ogbo ha nke mba Cameroon a na-akpọ 'Indomitable Lions' n'agba nke abụọ nke AFCON 2019.

Asọmpi a ga-ebiri ọkụ n'ụbọchị Satọdee abalị isii nke ọnwa Julai 2019 ma ọ kụọ elekere ise nke uhuruchi.

Mgbe ndị otu egwu bọọlụ Nigeria zutere ndị Cameroon nke ikpeazụ bụ mgbe ha sọrọ mpi n'afọ 2018 iji ma ndị ga-eso gbaa iko mba uwa na Russia.

Naijiria ji ọkpụ goolu anọ asataghi asata merie Cameroon na Uyo, Akwa Ibom steeti, ebe ha nyerịtara onwe ha otu goolu otu goolu na Yaounde.

Orji Uzo Kalu so na ndị ọrụ Ụlọomeiwu Ukwu a họpụtara

Image copyright Orji Uzo Kalu/Facebook

A họpụtala ndị ga-enye aka ịchịkọta Ụlọomeiwu Ukwu ndị gụnyreere aka chịburu steeti Abia bụ Orji Uzor Kalu bụ onye a họpụtara dịka 'Chief Whip'

Onyeisi ụlọ omeiwu ukwu bu Ahmad Lawan nọrọ n'ọgbakọ nke ndị omeiwu ahụ nwere n'ụbọchị Tuuzdee wee kpọpụta ha.

Ụkwụ Mikel apụọla n'Afcon?

Image copyright Getty Images

Akụkọ si mba Egypt na-ekwu na Mikel Obi agaghị eso na agba nke ọzọ nke AFCON 2019 n'ihi ahụ o merụrụ mgbe Super Eagles Zutere Madagascar.

Mikel merụrụ ahụ n'ikpere na asọmpi Naijiria na Madagaska tupu e webata Alex Iwobi ka ọ nọchie ya na nkeji 59.

Ka ọ dị ugbua, a na-atụ egwu na Mikel nwere ike ọgaghị agbakecha nke ọma tupu AFCON ahụ agwụchaa nke pụtara na ọ gaghị esokwa na gbaa bọọlụ ọzọ.

Mikel ekwubuola na asọmpi nke afọ a nwere ike ịbụ nke ikpeazụ ọ ga-esonye na iko mba Afrịka.

'Buhari ewepụtaghị aha ndị mịnịsta'

Image copyright Getty Images

Ụlọọrụ onyeisiala Naijiria agọọla na akụkọ na-efegharị na onyeisiala Buhari ewepụtala aha ndị Mịnịsta ya bụ asị ọcha.

Ọnu na-ekwuru Buhari bụ Garuba Shehu kwuru n'akụkọ dị otua esighi n'aka ya pụta.

Mouad Bouchareb achịsala ọwa

Image copyright Getty Images

N'ofesi

Onyeisi ụlọmeiwu mba Algeria bụ Mouad Bouchareb etinyela akwụkwọ arụkwaghịm dịka ngagharịiwe na ọgbaghara na-aga n'ihu maka ọnọdụ obodo ahụ.

Ndi na-eme ngaghariiwe chọrọ ka ndị ọchịchị obodo ahụ nile rituo ma gaa zara ọnụ ha n'ụlọikpe.

Gee akụkọ ndị a ebe a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe ruru mmadụ 50 anwụọla na Benue ka tanka gbara ọkụ

Image copyright Getty Images

Tanka bu mmanụ ụgbọala gbara ọkụ n'obodo Ahumbe n'ụzọ Alliade - Makurdi n'okpuruọchịchị Gwer East nke Benue steeti ebe ha chere na ọtụtụ nwụrụ, dịka onye hụrụ ihe mere sịrị kọọrọ ndị ntaakụkọ.

Ndị uweojii gwara BBC na mkpamkpa a mere n'elekere abụọ nke ehihie na Mọnde n'ụbochị Julaị nke mbụ, 2019.

Ọgọ Buhari apụtala n'aka ndị ntọ

Image copyright @IRT Nig Police Force

A tọhapụla Magajin Garin Daura, Alhaji Musa Umar Uba, n'aka ndị tọọrọ ya ka o mere ọnwa abụọ n'aka ndị ntọ.

Ndị otu isiekweọnwụ ndị uweojii a kpọrọ 'IGP Intelligence Response Team'(IRT) azọpụtala Alhaji Musa Umar Daura Magajin Garin Daura nke Katsina Steeti n'aka ndị ntọ.

A tọrọ nwaamadị ahụ kemgbe abalị mbụ nke ọnwa Mee afọ 2019.

Ndị ntọ ahụ tọọrọ ya bụ Eze obodo n'obodo ya na Kastina.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionEtu nwoke akpọrọ "Nigeria's Supercop" ji ebuso ndị ntọ na ndi ojieegbe ezu ohi agha na Naịjirịa.

Site na ntuziaka IGP Adamu Mohammed, ndị otu IRT nke onye ndu ha bụ Abba Kyari ji izu isii maa imi n'ala site na enyemaka ndị OC SIB Kaduna nakwa nke ndị Niger steeti ịchọta ya bụ Eze Obodo atọọrọ.

Ndị a mara imi n'ala ka nkịta chọwa Eze a ọhịa na ụzọ niile dị na Kaduna, Bauchi, Niger, Katsina, Katsina na Kogi Steeti bụ ebe ha nwụtara ndị omekome iri na otu nke gunyere onyeisi ha mazọpụtakwa Magajin Garin Daura n'akụkụ Panshakara dị na ime obodo Kaduna n'isi ụtụtụ taa bụ abalị abụọ nke ọnwa Julaị.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionKidnappers: Ndị ntọ asaala asịsa

Otu isi onye ntọ nara na ya bụ oke mgbọ ndị uweojii a kwara nke mere eji zọpụta ya bụ onye Eze.

A napụtarakwara ha ọtụtụ egbe AK47 na mgbọ mgbe anwụchiri ọtụtụ n'ime ha.

Image copyright @IRT Nig Police

Ihe karịrị mmadụ iri abụọ anwụọla na Benue ka tanka gbara ọkụ

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionỌkwa ụgbọala 'Awụbara m n'ọwa mmiri iji gbanarị ọkụ ahụ'

Ndị akaebe kọwakwara na ọ bụ mgbe ụgbọala ahụ chọrọ ize olulu dị n'okporo ụzọ ka ọ dara ma wusie ihe mmanu ụgbọala o bu n'okporo ụzọ.

Ka mmanụ a wasara n'ụzọ, ụfọdụ ndị obodo Ahume pụtara na-ekuru mmanụ a ka ọ na-awụpụ.

Ha kwukwara na ọ bụ otu onye ọkwụ ụgbọala gbafere mụnyere ha ọkụ.

Ụmụagbọghọ si akwụna n'ofesi lọta na-eti eti n'ụlọ - UK Home office

Image copyright Getty Images

Ụmụ mmadụ awụọla UK Home office ọnụ maka ịkwụ na ụmụagbọghọ sị Naịjrịa na-agbaga ofesi maka ịgba mbarama na-egosi nnukwu akụ na ụba ma ha lọta.

Kate Osamor bụ omeiwu na mba Uk sị na Home Office agbagheghị ahụhụ ụmụagbọghọ ahụ na-ata were kwuwe ụdị ọkwụ ahụ.

Achụọla Usman Yusuf na NHIS

Nkenke aha onyonyo Eboro Usman Yusuf ebubo ndekwuru nde

N'ikpeazụ, onyeisiala Mohammadu Buhari achụọla onyeisi National Health Insurance Scheme bụ Usman Yusuf ọnwa asaa kọmiti ehibere maka ịnyọche ya bụ nwaamadị kwụru otu ahụ.

Onyeisiala ewerelarị Mohammed Sambo dochie Yusuf bụ onye eboro ebụbụ ịmemina nde kwuru nde naịra.

Abbụọrụ ọzọ esiwela

Ndị otu Joint National Public Service Negotiating Council na ndị ọgbakọ otu ọrụ asatọ ọzọ efolara ntutu taa na ha ga-amalite abụbụ ọrụ ma gọmentị ebidoghị ụgwọ opekatampe ha kwere na nkwa.

Onyeisi ndị otu a bụ Anchaver Solomon sị na ha amalitela ịkpọkụ ndị otu ha na steeti niile maka nke a iji hụ na pụkụ iri atọ gọmenti kwetere bịara na mezu mgbe adịghị anya.

Nwoko zoro n'ụgbọelụ anwụọla

Image copyright PUBLIC DOMAIN

N'ofesi ozu otu nwoke eche na ozoro na kenya Airline adapụla na Heathrow Airport na London.

A na-eche na ya bụ nwoke amatabeghị onye ọ bụ zubara na ya bụ ụgbọelụ na Nairobi, kenya dịka ndị uweojii mba ahụ kwuru.

Venus Williams ebiela aka n'ala

Image copyright Getty Images

N'egwuruegwu, nwatanta ekponyela Ezenwaanyị tenis, Venus Williams aja n'ọnụ.

Cori Gauff gbara afọ iri na ise meriri Venus Williams jigoro tenis riwe ihe tupu amụọ ya n'afọ 2004 asọmpị ha na Wimbledon nke 2019.

Gee nkeji Igbo

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Lee ihe nkiri anyị

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionOnye ọja Gerald Eze

Akụkọ ga-amasị gị