AfCFTA: Uru atụmaatụ a ga-abara Naịjiria

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIhe Enelamah kwuru maka African Continental Free Trade Area (AfCFTA)

Dịka onyeisiala Muhammadu Buhari binyechara aka n'akwụkwọ maka nkwekọrịta azụmahịa na mba Africa, ọtụtụ mmadụ ka na-ajụ uru ọ ga-abara ha.

Lee ihe ise mbinyeaka a ga-emere Naịjirịa.

1. Ọ ga-eme ka Naịjiria na obodo ndị nọ n'Africa Union na-azụ ahịa ruru ogo pasenti iri isii (60%) karịa iri na isii ha na-azụbụ.

2. AfCFTA ga-emepụta ebe azụmahịa kachasị na mba ụwa niile.

3. Ọ ga-enye ndị na-azụ ahịa na Najirịa ohere iso mmadụ ruru ijeri abụọ zụkọta ahịa.

4.Ọ ga-enye ndị Naịjirịa sonye na akụnaụba ruru ijeri dọla abụọ nke ka akụ na ụba Naịjirịa.

5. Ụmụ Naịjirịa na-azụta ahịa ga-erite uru na ndọkọrịta ga-adị n'etiti ọtụtụ ndị azụmahịa.

Image copyright Bashir Ahmed/Twitter

Onyeisiala Mohammadu Buhari gara na Niger Republic ụbọchị asaa nke ọnwa July binye aka n'akwụkwọ maka atụmatụ "African Continental Free Trade Area"(ACFTA) ga-ahụ na mba Afrika na-azụkọta ahịa na-enweghị nsogbu.

O bụghị taa ka ekwụwere okwu ya bụ atụmatụ nzụkọrịta ahịa na mba Afrika.

Kedu ihe o ji dị mkpa na Naịjirịa binyere aka na ya bụ akwụkwọ?

Atụmatụ mekọrịta azụmahịa nke mba Afrika kpụrụ afọ n'ala afọ gara aga mgbe Naịjrịa jụrụ na ha agaghị entinye aka na ya.

Image copyright Bashir Ahmed/Twitter

Naịjrịa bụ mba kachasị na mba Afrika ma nọrọkwa n'isi ihe a na-eme na ya bụ ọgbakọ.

Mgbe Naịjirịa sepụrụ aka na ya bụ ọgbakọ, ụwa che na ọgbakọ azụmahịa mba Afrika akpụọla afọ n'ala kpam kpam.

Onyeisiala Buhari sị ka enye ya nwobere oge ka ya chebere ya bụ atụmatụ echiche.

Kemgbe ahụ otu ehibere ilebe anya na azụmahịa Naiịjrịa akpọrọ "Nigerian Office for Trade Negotiation" sị na ha na otu ruru iri abụọ na asaa etikọọla isi maka ya bụ okwụ mata iri dị na ya.

Uru dị na Naịjirịa ịnwete obosara ahịa na mba Afrika juru eju bara abara agbanyeghị na ọtụtụ na atụ egwu na ọrụ na ngwaahịa agaghịzị ezu ndị chọrọ ya.

Ugbua Naịjirịa tinyegoro aka na-akwụkwọ nkwekọrịta a, Afrika ịwete obosara ahịa buru ibu dịka Urop adịwala nso.

Image copyright Bashir Ahmed/Twitter

Ugbua Naịjrịa enweela ohere ịmekọrịta ha na mba ndị ọzọ nwere agba.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara