Emmanuel Amuneke na Tanzania enwela nkwekọrịta ka ọrituo dịka onye nkuzi otu egwuregwu bọọlu ha

Emmanuel Amuneke Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Emmanuel Amuneke du Tanzania ga Iko Mba Afịrịka mbụ ha kemgbe 1980

Ngalaba na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ na Tanzania bụ "Tanzania Football Federation" (TFF) na Bekee ekwuola na Monde na ha na Emmanuel Amuneke enwela nkwekọrịta ka ọ rịtuo n'ọkwa onye nkuzi otu egwuregwu bọọlụ ha.

Ihe a mere dịka Taifa Stars, bịala Iko Mba Afịrịka kemgbe 1980, achịtaghị aja ha tụrụ anya n'asọmpị Ijipt 2019.

Amuneke, bụ onye baala Naịjirịa bọọlụ, rigoro ọkwa dịka onye nkuzi n'afọ 2018 Akụkọ dị mkpa taa.

TFF sị na ha ga-ahọta onye ga-abụ onye nkuzi ha ma ha mecha nzukọ gbata gbata ụbọchị Tụrsde. Onye nkuzi ọhụru a ga-edu ha gaa nkwado Iko Mba Afịrịka nke akpọrọ "African Nations Championship" (CHAN) na Bekee.

Tanzania na Kenya ga-asụmpị eji ahoputa ndi ga-aga CHAN n'ọnwa a.

Amuneke, bụ onye gbaburu Naịjirịa na otu egwuregwu Barcelona bọọlụ, bụ osote onye nkuzi mgbe Naịjirịa buuru Iko Mba Uwa nke ndị dị afọ 17 akpọrọ Fifa U-17 World Cup tna mba United Arab Emirates n'afọ 2013.

N'afọ 2015, Amunike du Naịjirịa bute iko U-17 na Chile. A tụrụ ya ugo dịka onye nkuzi Flying Eagles.

Amunike so otu Super Eagles butere Iko Mba Afịrịka n'afọ 1994. Ọ bụ ya nyere goolu abụọ Naịjirịa ji merie Zambia n'asọmpị ahụ.

Ndị oji egbe awakpoola ndị mmadụ na Katsina Steeti

Image copyright Getty/AFP

Ndị uweojii si na ndị oji egbe na-eti "Allahu Akbar" wakporo ime obodo atọ wee gbuo mmadụ isii

Ndị a yi uwe dị ojii wakporo obodo Makers, Dan sabau na pawwa dị na mpaghara Kankara na mgbede Ụbọchị ụka

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Gambo Isah sị na ha gburu ọtụtụ ndị kpara ike a

Onye wakporo ụlọụka Anglican n'Aguleri?

Image copyright Getty Images

Uweojii Anambra Steeti ekwuola na ọ bụ ndị ohi gara n'ụlọụka Aglican dị n'Aguleri merụọ ụkọchukwu na ndị ọzọ ahụ.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Haruna Mohamed mere ka BBC Igbo mata nke a.

Na mba Kongo

Image copyright AFP

Ụlọikpe akpọrọ International Criminal Court na Bekee amaala Bosco Ntaganda bụ onye ndụ ndị agha nnupuisi na mba Kongo ikpe.

Ndi Ọkaikpe ụlọikpe ahụ sị na ndị na-eso nwoke a eji Terminator mara gbuwara ụfọdụ ụmụaka afọ ma jiri ndị ọzọ mee ndị agha ha.

N'egwuregwu

Image copyright Reuters

Nkeji:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIhe Enelamah kwuru maka African Continental Free Trade Area (AfCFTA)