House of Rep Principal Officers: 'Femi Gbajabiamila sị na iwe ya bụ na PDP etụnyeghịrị ya na ntuliaka'

Ndọrọndọrọ ụlọnọchiteanya nta

Ọnụ na-ekwuru onyeisi ndị PDP bụ Ike Abonyi ekwuola na pati ha ma na ihe na-eme n'ụlọnọchite anya nta gbara ọnye ga a bụ "Minority Leader" bụ mgba okpuru.

Abonyi kwuru na PDP ehiwela kọmiti ga-elebe anya na ya bụ okwu mara ebe ya bụ mmiri sị banye opi ụgbọnyiri.

Ọ sị na ya bụ kọmiti nke ndị isi pati ha na ndị ọkpamkpọ hibere na Tuzde nwere otu izuụka iji kwuo nchọpụta ha.

Abonyi sị na "ọrụ kọmiti a bụ ịchọ ka ga-esi weta udo".

Ọ kwesiri ike na ọ bụ mgbaokpuru mere onyeisi ụlọnta omeiwu bụ Gbajabiamela ji hapụ aha pati nyere ya kpọwa ọzọ.

Ụlọnọchite anya nke nta enweghị ezumike kemgbe izuụka gara aga maka okwu ihọpụta onye isi pati akacha nke atụrụ anya na ndị pati niile bụ ndị anọghị n'ọchịchị ga-ewepụta.

Onyeisioche ya bụ ụlọnọchite anya bụ Femi Gbajabiamila kpọpụtara aha Ndudi Elumelu (PDP) dịka onye pati ndị a niile chọrọ.

BBC gbara ndị ihe a metutera ajụjụ ọnụ ịmata nke bụ eziokwu.

Kingsley Chinda, onye bụ onye PDP kwadoro gwara anyị uche ya.

Chinda sị na ya atụghị anya na ya bụ okwu ga-aga ka ọ gara maka na uche ya adịghị na ya bụ ọkwa maka na ọ bụ nhọpụta ka a na-ahọpụta onye ga-anọ na ya, na ọ bụghị ntuliaka.

Okwuru n'ọgbakọ pati niile anọghị n'ọchịchị ugbua nwere n'Abuja na ha niile tikorọ isi ikwu udi ihe onye ga-anọ na ya bụ oche Minority Leader kwesiri ịnwe.

Chinda sị na "mmadụ ise họpụtara m ebe otu onye họpụtara Ndudi Elumelu."

Ndị bịara ya bụ ọgbakọ gara n'ihụ ịgwa ndị isi ka ha ga nyocha mmadụ abụọ ahụ ahọpụtara ma nye ha otu onye.

Akpọrọ ọgbakọ ọzọ n'abalị mbụ nke ọnwa Julaị ebe pati niile anọghị n'ọchịchị gbakọrọ ma lebe ka ndị nke Sineti siri mee nke ha.

Ebe ahụ ka Tobi Okechukwu kwuru na ndị Ọwụwa Anyanwụ ga-achọ ka ewere ntuliaka wepụta onye ga-anọchite anya ha karịa nhọpụta dịka emere na mbụ.

Wole Oke kwukwara ndị otu ha n'Ọdịda Anyanwụ kpokotara mbinyeaka ndị otu ha.

Ndị isi rịọrọ ka ahapụ aha ndị nke họpụtaburu ka ha gawa kemgbe ọ bụghị iwu na a aga eji ntulika wepụta ndị ga-anọ na ya bụ oche.

Onye APGA bụ Presige Osy rịọrọ na kemgbe etinyeghị ha na oke nke a, na ha ga-achọ ka echetakwa ha mgbe ọzọ a ga-eke ọkwa.

Chinda kwuru na "iwu ụlọnọchite anya bụ na pati ọbụla na-erughị iri agaghị anọ n'isi oche obụla. Kemgbe APGA bụ ndị nwere oche itoolu anaghị atụ anya isi oche ọbụla".

Ekwere ha nkwa na a ga-eme ka ha soro n'ihe a na-eme.

Chinda sị na-emechere hụ ka ụfọdụ na-ebugharị akwụkwọ na-arịọ ka ndị otu ha na-etinye aka.

"Anyị amaghị ihe ha chọrọ iji ya bụ akwụkwọ mee."

Ọ sị na ya gara n'ụlọọrụ onyeisi ya bụ ụlọnọchite anya nke nta bụ Femi Gbajabiamila ịjụ ya ma onwetala akwụkwụ ndị pati PDP deere ya maka nhọpụta ha mere, ọ sị na ya nweteghị ya.

Chinda sị na mgbe ya gachiri azụ ịjụ ya, ka Gbajabiamila gwara ya na onwere aha ndị ọzọ enyere ya nke ndị pati ndị ọzọ niile tinyere aka, ọ bụ nke ahụ ka ya ga-agụpụta.

Ọgwakwara ya na PDP etinyeghị ya na ntuliaka, ya mere ya agaghị akpọ aha ndị nke ha ziteere ya.

BBC kpọrọ Toby Okechukwu na Ndudi Elumelu mana ha azaghị ekwenti

Akụkọ ga-amasi gị

Lee ihe nkiri a

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionWidowhood in Nigeria: Etu m si gbalahụ mkpagbu a na-akpagbu ndị di ha nwụrụ