Kidnapping in Nigeria: Nwata a tọrọ ya na Ibadan, ndị mmadụ zọpụta ya na Legọs

Ahmad Saka bụ nwata a tọọrọ

Aka akpaarala otu nwoke onye a na-enyo na ọ bụ onye ntọ dịka ya na ndị otu ya bu nwata ha tọọrọ n'Ibadan bubata Legọs.

Nwata a kpọrọ Ahmad Saka dị n'agbata afọ iri na abụọ ka otu nwoke na mmadụ anọ ndị ọzọ tọọrọ n'Ibadan ma buru ya bịawa Legọs.

Mana chi zọrọ nwata ahụ oge otu nwaanyị nọ n'ụgbọala ya hụrụ ka nwata ahụ na-agba nịka nịka n'ime ụgbọala ndị ntọ ahụ ji buru ya ma nye ọkwọụgbọala ya ntuziaka igbochi.

Ngwangwa nke a mere , ọha mmadụ gbakọrọ ụgbọala ahụ nke mere ka ndị ọchọnganaoko mmadụ anọ hapụrụ ụgbọala ha wara ọsọ, ebe ọ fọrọ onye kwọ ha.

Saka gwara BBC na ha buru ya n'ebe a kpọrọ "Toll gate" n'Ibadan mgbe ọ na-aga ozi ndị ụlọ ya dunyere ya n'ihe dịka elekere atọ nke ehihie ụbọchị Wenezde.

Na mgbe ha rutere na Legọs ya amalite tiwe mkpu maka enyemaka nke mere otụ nwaanyị nọ n'ụgbọala na ndị ọzọ bịara gbapụta ya.

Mgbe ndị mmadụ rutere, mmadụ anọ ndị ọzọ gbara ọsọ ya fọdụzie otu nwoke bụ onye kwọ ụgbọala ahụ.

Nkenke aha onyonyo Ndị uweojii bịara kpụrụ nwoke a na-enyo na ọ tọọrọ nwata ahụ

Mgbe ndị mmadụ gbara nwoke ahụ ajụjụ ọnụ, ọ na-ekwu ka onyeisi na-ezughi oke.

Ndị uweojii ngalaba Ikoyi bịara nwụchie nwoke ma kpọrọ ya na nwata ahụ gawa n'ụlọọrụ ha.

Mgbe BBC Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Legos bụ Bala Elkana ọ zaghị ekwentị ya.

Akụkọ ndị ga-amasị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a