Abba women protest: Anyị chọrọ igbochi nsogbu n'etiti obodo Abba na agbataobi ha - Ndị Uweojii

Ụmụnwaanyị Abba n'azụ ahịa Image copyright David Eleke
Nkenke aha onyonyo Ụmụnwaanyị Abba n'azụ ahịa n'akụkụ okporoụzọ dịka ndị uweojii were ọnọdụ n'ahị Oye-Abba n'Anambra steeti

Ndi Uweojii Anambra steeti ekwuola na ihe mere ha ji nọchie ahia ndị obodo Abba n'Anambra steeti bụ iji gbochie ọgbaghara n'etiti obodo abụọ gbara agbataobi.

Ụbọchị Tuzde, ụmụnwaanyị obodo Abba tiri mkpu tigara gọọmenti steeti ahụ ka ọ gbatara ha ọsọ napụta ha n'aka ndị uweojii ndị ha boro ebubo iwakpo ahịa ha n'azụ kwa izu.

Ha na-ebo ebubo na kemgbe izuụka abụọ gara aga ha bịara ahịa were hụ ka ndị uweojii kpojuru ahịa ma were ikuku anyammiri chụsaa ha ka ha siri ụzọ ọzọ banye ọdọahịa ha.

Nchọpụta BBC mere na-arụ aka n'mgbochi ndi uweoji mere metụtara okwu ala dị n'etiti ndị Abba na ndị Ukpo bụ ndị agbataobi ha.

Image copyright David Eleke

N'ọsịsa sị n'aka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Haruna Mohammed nyere BBC Igbo, o kwuru na "ndi ụweojii anọchighị ahịa ọbụla."

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionỤmụnwaanyị na-agba egwu kama ime ntuliaka n'Imo steeti

" Anyị nwetara ozi na ọgbaghara na-achọ ịda n'etiti obodo abụọ, anyị were ziga ndị ọrụ anyị iji gbochie ọgbagharan'ebe ahụ."

Akụkọ ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIgbos in Egypt: 'Ị gaa Cairo, nri Igbo agaghị akọ gị'

Isiokwu Ndị Emetụtara