South Africa - Nigeria relations: 'Ogbugbu mmadụ dị elu na Saụt Afrịka' - Ezeali Jonas

Ihe karịrị mmadụ puku iri so mee ngaghari iwe maka "xenophobia" n'afọ 2015 na Durban Image copyright EPA
Nkenke aha onyonyo Ihe karịrị mmadụ puku iri so mee ngaghari iwe maka "xenophobia" n'afọ 2015 na Durban

Okwu banyere ọnwụ erughi eru ụmụ-afọ Naịjirịa na mba ofesi, ọkachasị Saụt Afịrịka so n'ihe akpụ n'ọnụ ugbua.

Mana Udeji Jonas Ezeali bụ Onowu Ndị Igbo bi na mba Saụt Afrịka, nke a na-akpọ ahụ ekwuola na o nweghị onye lekwasịrị ha anya maka ogbugbu na mba ahụ.

Maazị Ezeali si n'agbanyeghị na ogbugbu dị elu na Saụt Afrịka, na ọ bụghị na e bu ndị Naijiria n'obi kama na ndị Naijiria ọ metụtara bụ ihe ndakwasị dakwasịrị ha.

Okwu ya na-abịa dịka ụlọomeiwukwu gwara gọọmentị etiti ha manye ọkwa nye ndị Naịjirịa na-aga mba Saụt Afrịka.

Ọnọdụ a were bụrụ etu gọọmentị Naịjirịa siri saa okwu ọtụtụ mmadụ na-akpọ dịka ọnwụ erughi eru zutere nwa-afọ Naịjirịa bụ Elisabeth Ndubuisi Chukwu gara njem na mba ahụ.

Ha kwuru na nke a bụ iji mee ka ha chekwa onwe ha na mba ahụ maka oke ogbugbu mmadụ n'ebe ahụ.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ụmụafọ Naịjirịa 116 anwụọla n'ihe banyere Xenophobia na Saụt Afịrịka

Ezeali dụrụ ndị Naịjrịa ndụmọdụ ha kwadosie ike tupu ha abịa mba ahụ iji gbalahụ enweghi ọrụ.

"Nsogbu enweghị ọrụ dị elu na Saụt Afrịka, o nweghi onye ga-ahapụ ha nye onye Naịjirịa ọrụ."

Ka Ezeali si kwuo, o nweghị onye ọbụla ya ma a na-ebu n'uche iwakpo makana ọ bụ onye Naịjirịa.

N'aka ọzọ, o kwuru na mpụ karịrị na mba Saụt Afrịka.

"Ọ bu ebe dị ka New Yọrk ka a gaeji maa atụ ogbugbu mmadụ na-ame na Saụt Afrịka."

Ebe ọzọ ọ tinyere ọnụ bụ okwu banyere ire ọgwụ ike, bụ ihe ọ si butere ndị mba Saụt Afrịka jiri sị na-agba azụ inye ndị Naịjirịa akwụkwọ ịba mba ha.

Lee ihe o kwuru n'uju ebe a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionElisabeth Ndubuisi Chukwu: 'Ogbugbu mmadụ dị elu na Sawụt Afrịka'

Isiokwu Ndị Emetụtara