Nigeria Poverty Index: Ị dara ogbenye?

Nwaanyị na eri ji na akara
Nkenke aha onyonyo Ọtụtụ mmadụ na arụ ọrụ aka, mọ na azụ ahia

Akwụkwọ mpụtara ọhụrụ nke otu enyemaka bụ Oxfam wepụtara na-ekwu na pasentị 69 na mmadụ niile nọ na Naịjirịa dara ogbenye.

Mgbakọ ya gosiri na ọ bụ mmadụ nde 138 n'ime ihe karịrị nde 200 bụ ihe dara ogbenye na Naịjirịa.

Constant Tchona bụ onyeisi Oxfam na Naịjirịa kwukwara na Naịjirịa nọ n'ọkwa 125 n'ime mba 145 n'enweghi nhata nha.

O kwuru na gọọmentị etiti anaghị enyere ọnọdụ a aka site n'etinyeghi ego n'ihe gbasara ahụike, agụmakwụkwọ, mmiri ziri ezi nakwa ọnọdụ ụmụnwaanyị.

Etu ịga esi maraonye gbara ogbenye?

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Tomato na-adị arị elu n'oge udu mmiri.

Ụlọakụ Mbaụwa niile bụ World Bank manyere atụmatụ iji chọpụta ndị dara ogbenye na mba ọbụla n'afọ 1993.

Ya bụ na ọbụrụ na ịnaghị erite otu dọlla pụtara narị naira atọ na ọma kwa ụbọchị, ọ pụtara na ịdara ogbenye.

Mana ugbua, a na-elegara ihe ndị ọzọ anya ịji chọpụta ọnọdụ ogbenye dịka:

  • Agụmakwụkwọ
  • Iri nri dị mma
  • Ọnwụ nwa ọhụrụ
  • Ịga akwụkwọ
  • Ịnwe ọkụ latrik
  • Ịdebenwu ebe ịbi ọcha
  • Ịnwe ụlọ obibi
  • Ịnwe atụmatụ ịsi nri
  • Ịnwe mmiri dị ọcha
  • Ịnwe akụnaụba.

Ihe ndị ọzọ mpụtara ahụ kwuru

O nwere ụfọdụ ihe ndị ọzọ si na ya bụ akwụkwọ mpụtara pụta gụnyere:

  1. Gọọmentị Naịjirịa bụ otu n'ime ndị dị oke ọnụ na ụwa
  2. Ụlọọrụ pasentị 75 anaghị akwụ ụgwọ ụtụ isi
  3. Ezi nhatanha adịghị so n'ihe na-ebute mpu, esemokwu, oke ntọ na ala adịghị mma
  4. Enweghi nhatanha na-eme ka ọrụ na ohere ịnwe go ghara irute mmadụ niile aka ọ kachasị ndị gụrụ Mahadum.

Gịnị ka gọọmentị Naịjirịa na-eme?

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ọtụtụ mmadụ na-arụ ọrụ aka maọbụ na-ere ahịa iji jide obi aka

Gọọmentị Naịjirịa malitere ụfọdụ atụmatụ iji hụ na achụpụrụ ụbịam kpam kpam na Naịjirịa.

Ha gụnyere YouWin bụ nke bidoro n'afọ 2012 bụ nke na-enye ndị ntorobia chọrọ ịbido ahịa ego mbite.

Trader-Moni bụ atụmatụ ọzọ yiri ya na-enye ndị na-azụ ahịa ego mbite iji kwalite ahịa ha.

Ọzọ bụ N-Power bụ atụmatụ na-akwụ ndị enweghi ọrụ ụgwọ na-akuzikwara ha ihe tupu ha enweta ọrụ.

Mana ihe ndị a amịtabeghị mkpụrụ dịka ngụkọ ụbịam na-egosi na Naịjirịa ka na-abanye ụbịam n'ike n'ike.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionChild bride: Ụbịam so ebute nsogbu iluchu di

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a