Super Eagles Squad: Ị ma ndị otu egwu bọọlụ Super Eagles niile?

Mikel Obi Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo John Mikel Nchekwube Obi bụ onye ndị otu Super Eagles. Otu egwu bọọlụ Trabzonspor nke dị na mba Turkey bụ ebe ọ nọzi ugbua. Ọ bụ onye Anambra Steeti.

Ndị otu egwuregwu bọọlụ Super Eagles na-eme ụmụ Naijiria niile obioma n'asọmpi iko mba Afrịka nke afọ a.

Ha agafeela na agba abụọ nke ikpeazụ na ya bụ asọmpi ebe ha ga-ezute mba Ivory Coast maọbụ Algeria ụbọchị ụka, abali iri na anọ nke ọnwa Julaị.

Ị ma mmadụ ole so n'otu ndị Super Eagles? Ị ma aha ha na ebe ha na-agba bọọlụ?

Lee ya ebe a:

Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Ahmed Musa bụ nwa afọ Naijiria mbu nyere goolu abụọ na asọmpi iko mba ụwa. Ọ bụ onye Kano steeti. Ọ na-agbara ndị Al-Nassr nke Saudi Arabia.
Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Ighalo bụ mba China ka ọ nọ ugbua akpata ihe ọ na-eri. Ọ na-agbara ndị otu egwu bọọlụ Shanghai Greenland Shenhua. Ọ bụ onye Edo Steeti
Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo William Troost-Ekong na-agbara ndị Udinese nke mba Italy. Nne ya bụ onye mba Netherlands ebe nna ya bu onye Akwa Ibom steeti.
Image copyright EPA
Nkenke aha onyonyo Balogun bụ onye Naijiria bụrụkwa onye Germany. Nna ya bụ onye Ijebu-Ode na Ogun steeti. Ọ na-agbara Brighton and Hoves Albion nke mba England.
Image copyright Rex Features
Nkenke aha onyonyo Kenneth Omeruo bụ onye otu Chelsea nke England mana ọgbabeghi bọọlụ ebe ahụ ma otu. Chelsea na-ezipugharị ya na-enya otu egwu bọọlụ dị iche iche. Ọ bụ onye Abia.
Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Oghenekaro Etebo na-agbaburu Warri Wolves nke Delta Steeti. Ebe ọ nọ ugbua bụ Stoke City nke mba England. Ọ bụ onye Delta steeti.
Image copyright Twitter/Alex Iwobi
Nkenke aha onyonyo Alex Iwobi na-agbara Arsenal nke England bọọlụ. Ọgba bọọlụ a ma ama bụ Jay Jay Okocha na Nne Iwobi bụ otu nne ji ha. Nna ya bụ onye Anambra ebe nne ya bụ onye Delta steeti.
Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Wilfred Ndidi bụ ịgba etiti (midfield) ka e ji mara ya. Ọ na-agbara otu Leicester City nke England. A mụrụ ya na Legos steetiu. Nna ya bụ onye agha.
Image copyright Twitter/John Ogu
Nkenke aha onyonyo Ugochukwu John Ogu sonyere ndị otu Super Eagles n'afọ 2013. N'ọnwa Mee afọ a ka ọ hapụrụ otu Hapoel Be'er Sheva nke mba Israel. Amabeghi ebe ọ ga-aga ọzọ.
Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Chidozie Awaziem bụ onye Enugwu steeti. O na-agbara ndị FC Porto nke Portugal, mana e zipuru ya gaa Çaykur Rizespor.
Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Abdullahi Shehu bụ onye Kano steeti. Ọ na-agbara ndị Bursaspor nke mba Turkey. Ọ gbaburu Kano Pillars
Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Daniel Akpeyi bụ ochee goolu. Ọ bụ ndị Kaizer Chiefs nke South Afrịka ka ọ na-echere. Ọ bụ onye Nnewi na Anambra Steeti.
Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Samuel Kalu dị afọ 21. Ọ na-agbara Bourdeaux nke France. Ọ bụ onye Abia steeti.
Image copyright Twitter/Ola Aina
Nkenke aha onyonyo Temitayo Olufisayo Olaoluwa (Ola Aina) na-agbara ndị Torino nke mba Italy bọọlụ. Ọ gbaarala ndị mba England n'ogogo 'Under 16, 17, 18, 19 na 20'
Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Jamilu Collins bụ onye Kaduna steeti. A mụrụ ya na 1994. Otu egwu bọọlụ ọ nọ na ya bụ SC Paderborn 07 nke Germany.
Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Moses Simon na-agba bọọlụ na Levante nke Spain. A mụrụ ya na Jos Naijiria n'afọ 1995
Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Henry Onyekuru bụ onye Anambra. Ọ na-agbara ndị Galatasaray nke mba Turkey, mana ndị nwe ya bụ ndị Everton nke England.
Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Paul Onuachu na-agbara FC Midtjylland nke Denmark. A mụrụ ya n'afọ 1994 n'Owere dị n'Imo State
Image copyright EPA
Nkenke aha onyonyo Samuel Chukwueze bụ okwu a kpụ n'ọnụ ugbua. Nwata nwoke a na-agbara ndị Villareal nke Spain. Ọ bụ onye Umuahia dị n'Abia steeti. Ọ gbara naanị afọ iri abụọ.
Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Francis Uzoho na Ikechukwu Ezenwa bụ ndị ochee bọọlụ Naijiria. Uzoho bụ onye Imo steeti nọ mba Spain, ebe Ezenwa na-echere ndị Katsina United.
Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Victor Osimhen bụ onye Edo State. Ọ na-agbara ndị Sporting Charleroi nke mba Belgium. Ọ dị afọ iri abụọ.

Akụkọ ga-amasị gi: