Igbo Folktales: Kedu uru akụkọ ifo baara Ndigbo?

Akúkó ifo Image copyright Getty Images

Akụkọ na egwu Mike Ejiagha bụ ụzọ akụkọ ifo ndị Igbo ka ji dị ndụ taa.

Nke a mere BBC ji dee edemede a maka akụkọ ifo iji kpọllite mmụọ ndị ọgbara ọhụrụ n'ihe gbasara akụkọ ifo.

Anyị gara hụ ndị ọkammụta n'Igbo na Mahadum Legọs ka ha kọwaara anyị ihe bụ akụkọ ifo na uru ọ bara.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionEgwu Chinyere Amaka Ifechukwu

Gịnị bụ akụkọ ifo?

Ada Anachebelu bụ onye nkuzi na ngalaba Afịrika na Eshia na Mahadum ahụ kọwara akụkọ ifo ka:

"Otu n'ime ngalaba agụmagụ ọnụ ndị Igbo nwere.

Ọ bụ akụkọ ekere uche nke gbadoro ụkwụ n'ihe emeghị eme, gbado ụkwụ n'agwa mmadụ, agwa anụmanụ na agwa ndị mmụọ.

Ọ bụ usoro ndị Igbo ji akụziri ụmụ ha, ma na-azụlite ha n'usoro ebimndụ, omenala na nkwenye ndị Igbo."

Nkenke aha onyonyo Ebele Okafor Onye nkuzi na Mahadum Legọs

Ebele Okafọr nke Mahadum ahụ kwenyekwere na "akụkọ ifo bụ akụkọ ọ dị n'ala nke bidoro na oge gboo, ma gbado ụkwụ n'ala mmadụ, ala anụmanụ n'ala mmụọ bụ nke eji akụziri ụmụaka ezi omume".

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionOnye ọja Gerald Eze

Gịnị ka a na-ahụ n'akụkọ ifo?

Ọkamụta Chigozie Nnabụihe nke Mahadum ahụ kwuru na ọ bụ n'ime akụkọ ifo ka a na-ahụ "omenala, ahụmihe ụwa, ọdị na mbụ, ọdị mgbe ochie, ọ dị be ndị ndị nwe akụkọ ifo ahụ".

Nkenke aha onyonyo Chigozie Nnabuihe Onye nkuzi na Mahadum Legọs

Nnabuhie sị na ihe mere eji akọ ifo n'ọnụ bụ ederede abịabeghị mgbe ebidoro ya mgbe gboo, bụ nke mere eji sị n'aka nne na nna na-enyefe ya ndụdụgandụ, nke ga-abụ ihe ga-edu ya na ndụ ya na ọ dị n'ihu.

Nnabuihe sị na Ifo bụ mkpụrụ a na-akụ n'echiche ụmụaka ka onwere ya too, banye ya n'ime, banye ya n'ime mmụọ, banye ya n'akparamagwa.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionKilliwee Nwachukwu story

Uru akụkọ ifo baara ndị Igbo

  • E ji akụkọ ifo akụziri ụmụaka ihe gbasara omenala Igbo, nsọ ala na nkwenye ndị Igbo.
  • E ji ya eme ka ụmụaka mara na arụrụala adịghị mma.
  • Ọ na-enye aka ka ụmụaka mata na oke ọchịchọ, ohi na anyaukwu adịghịmma.
  • Ifo na-enye aka ịme ka ụmụaka mata ezi mmekọrịta mmadụ na ibe ya ọkachasị n'ezinaụlọ.
  • Ọ na-akụziri ụmụaka ihe dị mma na ihe dị njọ mee ka ha gbaara ihe dị njọ ọsọ.
  • Nnabuihe kpokotara okwu a isi ikwu na e ji ya enye ọzụzụ nke ga-enye aka ka nwata too n'ụzọ dị mma.
Nkenke aha onyonyo Ada Anachebelu

Kedụ ihe mere na akụkọ ifo na alazị?

Nchọcha Ada Anachebelu gosiri na ọtụtụ nne na nna enweghịzị mmasị na ebe agụmaagụ na omenala ndị Igbo dị.

Nke a mere na ha anaghịzị ewepụtara ya oge ikuziri ụmụ ha.

Ụfọdụ nne na nna nwere mmasị enweghịzị ohere n'ihe ọnọdụ akụ na ụba obodo Naịjirịa dị.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionGịnị bụ ọfọ?

Ọtụtụ ndị Igbo enweghịzị mmasị n'isụ asụsụ Igbo.

Ada Anachebelu sị na, n'ihe nke a akụkọ ifo enweghịzị ọnọdụ n'ebe ọtụtụ ndị Igbo nọ.

Okwukwara na itufu akụkọ ifo ga-enye ezigbo nsogbu n'ịzụlite ụmụaka ugbua.

Gịn ga-eme ka mmasị gbagolite ọzọ?

Itinye akụkọ ifo na nke Bekee kpọrọ "Cartoon" ga-enye aka ime ka mmasị ụmụaka gbagolite ọzọ n'akụkọ ifo.

Lee ihe nkiri

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionMike Ejeagha: Aghara m ihe egwu m gbaa ọsọ Agha

Akụkọ ga-amasị gị

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a