Ruga Settlement: Ihe asaa dị ọkpụrụkpụ Ralph Uwazuruike kwuru butere ụka

Ralph Uwazuruike, onye ndu MASSOB Image copyright Getty Images

Onyendu otu 'Biafra Independent Movement (BIM)' bụ Ralph Uwazuruike azaala ndị uweojii nzuzo Naijiria a kpọrọ DSS n'aha ịchafụ oku ha kpọrọ maka okwu gbasara Ruga.

N'abalị Wenezde, Uwazurike gbara ama na ndị DSS ziteere ya ozi n'ekwentị ya sị ka ọ bịa hụ onyeisi ha n'isi ụlọọrụ ha n'Owere, Imo steeti.

A na-eche na oku ahụ metụtara ozi Uwazuruike wepụtara n'ihe onyonyo ebe ọ kpọrọ Ndị Igbo oku ka ha gbakọta ọnụ jụ atụmatụ 'ruga settlement.'

Mgbe BBC Igbo kpọrọ Uwazuruike iji mata ije ya na ndị DSS, Ọ saghị ekwentị ya nke o ji asa ozi anyị zigara ya.

Mana ọnụ na-ekwuru otu BIM bụ Chris Muochia gwara BBC Igbo sị na Uwazuruike gara zaa oku a kpọrọ ya.

Mana o kweghị ekwu ihe Uwazurike na ndị DSS kpara.

"Ọ bụ Uwazuruike na onwe ya nwere ike ịgwa unu ihe ya na ndị DSS kpara."

"Ọ bụrụ ihe ndị ọzọ gbasara otu anyị, aga m azali gị ya."

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media caption2019: E ji Ndigbo eme akaje

Ihe asaa dị ọkpụrụkpụ Uwazuruike kwuru butere ụka

N'ihe onyonyo nke Uwazuruike wepụtara n'intanetị ọ sịrị na o teela ya ji ama ọkwa ihe ndị dabidoro Ndị Igbo na Naijiria ugbua.

Lee ihe ndị ọzọ o kwuru:

1. "Mmiri na-achọ ịma Ndị Igbo."

2. Ọ rụtụrụ aka na "Nsogbu Ndigbo nwere bụ ndị na-achị ha - ndị gọvanọ Ọwụwa-Anyanwụ na ndị ndu Ohaneze."

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media caption"Anyị ga-edulata nna mụrụ Nnamdi Kanu" - Ikpeazu

3. "Buhari pụtara sị na ya akwụsịla ruga, otu nwatakịrị ha zinyere pụtara nye iwu."

4. Onyeisi Ohaneze pụta sawa nwatakịrị okwu, onyeisi ndị ọhaneze na-asa ya, ọ maghị na o nwere ndị zigara nwata ahụ. Nwa nza nọ na-agba egwu, o nwere ihe na-etiri ya egwu."

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIhe Charly Boy kwuru maka ndị ndọrọndọrọ na ndị ntoroọbịa

5. Uwazuruike tara ndị ndu Ohaneze ụta sị "Nzụkọ ole ka ị kpọrọ Ndigbo tupu ị sị ha zọwa onwe ha."

6. "Naijiria ga-ekewa mana ọ bụghị site n'ọbara Ndigbo."

6. "O nweghị ihe dịka 'restructuring'. Mmezi okwu gbasara Naijiria bụ Naijiria ikewa, onye ọbụla agawara onwe ya."

7. "Nsogbu Naijiria enweghị mmekwata."

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a