Nigerian music: Ihe mere o ji dị ka ndị Igbo na-ala azụ n'egwu - Ruffcoin Nwa Aba

Nwa afọ Igbo a ma ama na-eti egwu aha ya bụ Ruffcoin Nwa Aba tinyere ọnụ n'okwu banyere ndị kachasị ewu ewu na Naịjirịa.

Ọ gwara BBC Igbo na ndị mpaghara Ọdịda-Anyanwụ kachasị ewu makana ọ bụ n'aka ha ka ihe mgbasaozi kacha dị na Naịjirịa.

O kwuru sị, "Ọ bụ ha kacha nwee ụlọọrụ mgbasaozi, nke mere o ji na-enye ndị be ha ohere iwepụta egwu ha ka ndị mmadụ mara na ha ka nọkwa ya."

Ọ gara n'ihu sị na ndị Ọwụwa-Anyanwụ kwesịrị itinye uche mee ka ha gbagote n'ọkwa.

Nwaamadị a gakwara n'ihu dụọ ndị ntoroọbịa ọdụ ka onye ọbụla jisi ike n'ihe ọbụla ọ na-eme.

Nkenke aha onyonyo Ruff Coin Nwa Aba kụrụ egwu mbụ ya n'afọ 2002 mana egwu buputara ya bụ nke a kpọrọ "Nwa Aba" nke ọ kụrụ n'afọ 2007

Nwa Aba kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ndị BBC Igbo nwere n'ihe omume a kpọrọ "Gịnị na-afịọ?".

Ọ kọwara na ọ bụghị taa ka o bidoro kụwa egwu, mana ọ bụ n'afọ 2007 ka ọ chakere n'ihi na ọ daghị mba n'ọrụ.

N'ọnụ ya, "Ihe ọbụla onye na-eme, ya mepagide ya, otu ubọchị ọ ga-akwụta ụgwọ.

"Ọbụladị mmiri na-atụ pem pem, ọ ga-atụgide otu ahụ tụpuo ala kọnkịrị".

Maka Biafra:

Image copyright Getty Images

Nwa Aba kwuru na Biafra ga-amagbu onwe ya ma ọ bụrụ na enweta ya n'udo.

Mana ọ gaghị abụ ihe ọgụ na mgba.

O kwuru sị, "Biafra bụ ihe ziri ezi. Anyị nweta Biafra ọ ga-adị mma, mana ọ bụ usoro e ji agbaso ya ka a ga-eleba anya.

"A ga-achọ etu ndị okenye ga-esi nọrọ ala kpaa ya iji nweta ya n'ụdị udo".

Lee ihe nkiri ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAchọrọ m ịgụ egwu n'eluigwe - nwaanyị na-agụ egwú n'ahia

Akụkọ ga-amasị gị: