Serena Williams: Simona Halep egosila ya ihe ọkụ ji ntị oke eme

Akụkọ kpụ ọkụ n'ọnu n'ụtụtụ a

Simona Halep meriri Serena Williams

Image copyright AFP/Getty Images

N'egwuregwu, ọ dịka agadinwaanyị akawala nka n'egwu ọ ma agba ebe Simona Halep meriri Serena William na asọmpi tenis apịara ụbọchị Satọde na Wimbledon.

O ji 6-2 6-2 merie Serena na nkeji 56" ebe ọ nọ kwuo na ya apịnubeghị ụdị bọọlụ a mbụ.

Serena eturula ugo Grand Slam ugboro iri abụọ na atọ (23) ebe Simona Halep ritegoro ya naanị ugboro otu ugboro.

Sịnatọ Abbo abanyela na nsogbu ọzọ

Image copyright Elisha Abbo /Facebook

Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwụ na ndị omekome wakporo be Sen Ishaku Abbo n"Adamawa steeti n'isi ụtụtụ satọde ga tọrọ nwunye nna ya ma gbagbuo nwanne nna ya.

Sinatọ Abbo bụ onye gwara BBC nke a n'ehihie sị na ya amaghị ma ọgbasa gbagharị ọ nọ n'ime ya maka nwata nwanyị asị n'ọmara ụra.

Christian Chukwu alọtala

Image copyright @realFemiOtedola
Nkenke aha onyonyo Chukwu bụbụ onye nchịkọta otu Super Eagles

N'akụkọ ọzọ, Christian Chukwu bụ onye bụbu onyendụ Super Eagles bụ nke gara ụlọọgwụ na mba ofesei maka ọrịa ọ dara abatala n'ahụike.

Chukwu gara kelee Femi Otedola bụ onye nyere ya nkwaodo ojiri mee ya bụ njem n'ọnwa Mee.

Otedola sị na obi dị ya mma ka ya siri nyere Chairman Chukwu aka karịa ịwere ya bụ ego ṅụọ mmanya.

Ọ sị na ya mefuru ihe ruru nde Naịra iri atọ na isii na ụma (N36, 635,000) n'isi Chukwu.

Adaala Facebook nha ijeri dọla ise maka amaghị eme

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Cambridge Analytica bụ ụlọọrụ mba Britain na-ahụ maka ichekwa ozị

N'ofesi, ngalaba nke Federal Trade Commission nke mba US ekpebiela na Facebook ga-akwụ nha dị ijeri Dọla Ise maka ịresị Cambridge Analytica aha ndị mmadụ maka ntuliaka 2011 n'US.

Iwu kwuru na Facebook kwesiri ịgwa ndị mmadụ tupu ha emee otu a, mana ọ dịghị ka ha emere ya.

Gee nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Na Kano nwaanyị wụru di ya mmiri ọkụ

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ọkọrọtọ ndị uweojii Naịjirịa

Lauratu Ahmad ji iwe na di ya bụ Aliyu Ibrahim Fayan-fayan ha ahazi ịlụ nwaanyị nke abụọ were jiri mmmiri ọkụ saa di ya ahụ.

Fayan-Fayan na-anata ọgwụgwọ ugbua sị na nwunnye ya gbara ọsọ ka ọkpachara mkpa mkpa a.

Ọ gwara ụlọ ntaakukọ Daily Trust sị, "Ka m gwara ya na m chọrọ ịnụta nwaanyị ọhụrụ, onweghị mgbanwe m hụrụ n'agwa ya. Nke kachasị bụ na ọ gwara m na ya ga-eso ndi ga-azụ ihe a ga-eji mee agbam akwụkwọ."

Fayan-fayan sị na ọ bụ ka ọ lọtara n'abalị na-ege redio ka nwụnye ha buru miiri ọkụ wụọ ya n'ahụ.

Nwoke a nọzị anata ọgwụgwọ na ụlọ ọgwụ ọha dị na Danbatta sị na ọ bụ ụmụ 10 ka ya na nwunye ya ji.

Ndị omekome egbuola nwa onyeisi Afenifere

Image copyright @chimbiko_jerome

Ndị uweojii ekwuola na ọ bụ ndị ntọrị gburu Funke Olakunrin bụ nwa onyeisi otu jikọrọ ndị Yoruba bụ Afenifere.

Ha sị na ndị a e che na ha nọ njem ntọrị ruru mmadụ iri na ise si ọhịa pụta wee wakpo ụgbọala abụọ na-agba n'okporo ụzọ dị nso n'obodo Ore

Ndị omekome egwuola ọtụtụ mmadi na Somalia

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Al Shabab has carried a string of deadly attacks in Somalia in recent years

Ihe ruru mmadu asaa anwụọla na mba Somalia dịka ndi omekome bu ọgbọala ha kwajuru ogbunigwe baa n'ime ụlọ ndina na obodo Kismayo.

Anya hụrụ alụ a kwuru na ndị oji egbe so kwa na ndị mere mwakpo a

Ndị otu al-Shabab si na ọ bu ha kpara ike a.

Serena ga-ezute Halep taa

Image copyright Getty Images

Ọka ibe n'ịpịa bọọlụ tennis bụ Serena Williams na-achụ iko Wimbledon nke asatọ ya taata mgbe ọ ga-ezute Simona Halep.

Williams emeriela Halep ugboro itoolu n'ime ugboro iri ha zutere n'asompi tennis

Gee nkeji ndị a ebe a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri anyi taa:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionWidowhood in Nigeria: Etu m si gbalahụ mkpagbu a na-akpagbu ndị di ha nwụrụ