Kismayo attack: Ndị nwụrụ na mwakpo ụlọ ndina na Somalia eruola 26

A man stands at the scene of a hotel attack in Somalia Image copyright AFP

Ihe ruru mmadụ 26, ọkachasị n'ime ha bụ ndị mbịara mbịa na ndị ntaakụkọ, bụ ndị egburu n'ụlọ ndina n'ugwu mba Somalia.

Otu onye nya ụgbọala ogbunigwe dị baa n'ime ụlọ ndina Asasey dị na ụdọ ụgbọ mmiri Kismayo.

Ndị ji egbe so mee mwakpo a.

Ndị omekata pụọ ụjọ akpọrọ al-Shabab kwenyere na ọ bụ ha kpara ike a.

Ndị Kenya atọ, ndị Tazania atọ, ndị Amerịka abụọ, otu onye mba Briten na otu onye ntaakukọ Somalia aha ya bụ Hodan Naleyah nakwa di ya gunyere n'ime ndị nwụrụ.

Kedụ etu mwakpo a jiri mee?

Ndị ndọrọndọrọ na ndị ọchịchị obodo no n'ime ụlọ ndina eme nzukọ maka ntuliaka ha chọrọ ime mgbe mwakpo a malitere.

Ndị hụrụ mgbe ihe a mere sị na ha nụrụ nnukwute ụda tupu ọtụtụ umu nwoke kwajuru gwa ọgụ ahụ wabata.

Hussein Muktar, otu onye n'ime ndị hụrụ ihe mere, sị; "Nnukwu ọgbaghara dara n'ime ụlo ndina ahụ. A hụrụ m ọtụtụ ndị nwụrụ anwụ n'ala, ma hụkwa ndị si ụlọ ndị dị nso na-agba ọsọ."

Elekere ọtụtụ gara tupu ndị ọrụ nchekwa napụ ndị omekome a ụlọ ndina ahụ.

Aka na-achị mpaghara Somalia ihe a mere bụ Ahmed Mohammed sị na ndị nwụrụ bụ mmadụ 26 ebe ndị merụrụ ahụ dị 50.

Egbụrụ mmadụ anọ n'ime ndị a mere mwakpo a.

Kemgbe 1988 amalitere agha nwanne na nwanne na Somalia, mba ahụ aṅụbeghị mmiri tọgbo iko..

Akụkọ ga-amasị gị: