Senator Elisha Abbo: Ndị gburu nwanna nna m, tọọrọ nwunye nna m che na a bụ ide ego

Senetọ Elisha Ishaku Abbo Image copyright Elisha Ishaku Abbo/Twitter

Sineto Elisha Abbo gwara BBC na ndị ọmabeghi ndị ha bụ wakporo be nna ya, gbụọ nwanne nna ya ma tọọrọ nwunye nna ya.

Sinetọ Abbo bụ onye a ka kpụ n'ọnụ maka ihe nkiri pụtara ebe ọ mara nwata nwaanyị ọra n'ebe a na-ere utu rọba n'Abụja sị na ọ bụ n'ọnụ ụtụtụ taa ka ihe a mere.

"Ndị a bịara, gbaa nwanne nna m egbe n'afọ tupu ha akpụrụ nwunye nna m gbalaga."

O kwukwara na taa mere ya abalị iri na otu nwunye nna ya ahụ mụchara nwa ọhụrụ.

Abbo sị na nwata ọhụrụ ahụ esoghi na ndị atọọrọ.

Maazị Abbo sị na ya achọghị ịsị na ọ bụ maka okwu ụra ahụ ọ mara nwaanyị butere ya bụ mnwakpo.

Ọ sị, "Ejighị m maka ego bata ndọrọndọrọ ọchịchị. A zọrọ m ọchịchị iji nyere ndị be anyi aka, ọ bụghị maka na m hụrụ ndọrọndọrọ n'anya.

"Onwereike ọ bụrụ na ha che na m nwere ego mere ha jiri bịa.

Mana enweghị m ego. Onwebeghi mgbe m rụru gọọmentị ọrụ."

Ndị uweojii si na ihe a mere na ogige Muchall dị na okpuru ọchịchị Mubi Nọt dị n'Adamawa steeti.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionElisha Abbo: Etiri m ya ihe iji bọọ ihe o tiri nwanne m nwaanyị