'A dụrụ ihe onyonyo ahụ tinyere m na nsogbu na mahadum Ghana adụ'
Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi

Austin Nwagbara: A dụrụ ihe onyonyo ahụ tinyere m na nsogbu na mahadum Ghana adụ

Nwafọ Igbo bụ ọkammụta asụsụ Bekee na Mahadum ‘University of Lagos’ bụ Austin Nwagbara danyere na nsogbu n’ọnwa June na mba Gana ebe ọ nọ ezumike nkuzi otu afọ (sabbatical)n’ihi ihe onyonyo ebe o kwuru na agụmakwụkwọ mahadum Naijiria ka nke Gana mma.

Okwu ahụ rụrụ ndị gọọmenti Gana na ụlọakwụkwọ ọ na-akụzi afọ nke mere ka ha chụrụ ya n’ọrụ n’ike dịka ha siri wepụta ozi na webụsait ha.

Ha kwuru na ihe o kwuru na ihe onyonyo banyere agụmakwụkị̀ọ Gana ahụ abụghị eziokwu.

Mahadum ahụ kwukwara na "nnyocha anyị mere gosiri na Ọkammụta Austin Nwagbara kpara ajọ agwa anyị were chụọ ya n'ọrụ."

Na mkparịtaụka BBC Igbo na nwa amadi a bụ onye Abịa nwere, ọ ọkọwara na ndụ ya koro n’elu dịka ndị amaghị ndị ha bụ bidoro ịchọga ya n’ụlọakwụkwọ mebe ụfọdụ na-akpọ ya n’ekwentị.

Ọ kọwara na ọ bụ n'ọgbakọ ịkpa etu ụmụ Naijiria ka esi agbalahụ mkpagbu ụmụ Naijiria na-agabiga n'aka ndị Ghana ka o kwuru.

Gee ihe o kwuru n'uju:

Isiokwu Ndị Emetụtara