FaceApp Challenge: Obi ọkara gị itinye foto gi ka FaceApp gbanwee ya?

Ndị ama ama ji FaceApp gbawe ihu ha

Mmadụ niile na-ekwu maka 'FaceApp' bụ akụrụngwa na-agbanwe foto mmadụ, mee onye bụ nwata ka ọ dị ka okenye.

Puku kwuru puku mmadụ na-eke mpụtara ihe ha ji akụrụngwa FaceApp mee na soshal midia.

Mana ụfọdụ mmadụ ekwuola na obi adachaghị ha duu maka ya.

Ha sị na ụlọọrụ mepụtara ya bụ akụrụngwa anaghị akpachapụ anya etu ha si ejikwa ozi gbasara ndị mmadụ ha ji foto ha rụọ ọrụ.

Mana FaceApp sịkwa na ha na ehichapụ ọtụtụ n'ime foto na-abata ha aka.

Ha sị na ọbụ naanị foto ndị mmadụ hopụtara ka ha na-ewerụ emepụte foto ahụ na-ewu.

Ọ gịnị bụ FaceApp?

FaceApp abụghị ihe ọhụrụ. Ọ bụ ihe eji kọọ akụkọ n'afọ abụọ gara aga maka ihe Bekee kpọrọ "ethnicity filters".

"Filter" ahụ na-agbanwe agbụrụ mmadụ - nke mere ọtụtụ mmadụ ji katọọ ya nke mere ejiri wepu ya.

Akụrụngwa a nwereike ime ka ihu na-ewe iwe chịwa ọchị. Ọ na-agbanwekwa usoro eji achọ ihu mma.

Image copyright Olly Gibbs
Nkenke aha onyonyo Akụrụmgwa na-arụkwa ọrụ n'ihe nka

Ọ bụ ihe akpọrọ "artificial intelligence" (AI) ka akụrụngwa a ji arụ ọrụ.

Ihe ndị tecknuzu kpọrọ "algorithm" na-ewere foto ihu mmadụ wee gbanwee ya.

Ọ bụ nke a ga-enye ohere itinye ọchị na foto ka ọ dị ka ọ bụ etu ahu ka eji mee ya.

Ọ gịnị bụzị nsogbu?

Ndị mmadụ weliri nku anya ha mgbe otu onye na-eme akụrụngwa internet aha ya bụ Joshua Nozzi dere na Twitter na FaceApp na-etinye ọtụtụ foto ndị mmadụ na internet na-ajụghị ha.

Mana, otu onye Frans na-eme nchọpụta maka nchekwa na intaneti eji Elliot Alderson mara mere nyocha ihe Maazị Nozzi kwuru.

Ọ chọpụtara na onweghị ihe di otu a na-eme. Naanị foto ndị mmadụ tinyere ka FaceApp na-etinye na intaneti.

Ndị ụlọọrụ FaceApp na onwe ha gwara BBC na ọ bụ sọsọ foto ndi mmadụ tinyere ka ha ji arụ ọrụ.

Kedụ maka ihe Bekee kpọrọ 'facial recognition'?

Image copyright FaceApp
Nkenke aha onyonyo FaceApp nwere usoro eji agbanwe foto

Ụfọdụ na-ekwukwa na ụlọọrụ FaceApp nwere ike iji akụrụngwa ahụ mepụta akụrụngwa ọzọ e ji ahụwa mmadụ ama.

Mana Yaroslav Goncharov bụ onyeisi ụlọọrụ ahụ gwara BBC na nke ahụ abụghị eziokwu.

O kwuru si, "Mba, anyị ejighị foto ndị mmadụ arụpụta ihe banyere ịmatanwu ihu mmadu(facial recognition) Ọ bụ sọsọ iji ya gbanwe foto ka anyi ji ya eme."

Gini ọzọ ka FaceApp nwere ikwu?

N'akwụkwọ ozi nke ụlọọrụ FaceApp wepụtara, ha kọwara na ọ bụ naani foto mmadụ ji aka ya họrọ ka ha na-agbanwe.

"Anyị anaghị ewere onyonyo mmadụ na-enyeghị anyị ikike iwere.

"Anyị nwere ike ichekwa foto ndị mmadụ n'ikuku (cloud) mana anyi na-ehichaopụ ọtụtụ foto ndị mmadu ma o mee abali abụọ ha ji ya mechaa ihe.

Gọọmenti Briten kwuru na uche ya dị n'ọtụtụ ihe ndị mmadụ na-ekwu banyere akụrụngwa FaceApp.

Ha dụrụ ndị ọha obodo ọdụ ka onye ọbụla kpachapụ anya n'ihe gbasara akụrụngwa ịntanet.

Ha kwuru na tupu mmadụ etinye ihe ọbụla dị ya mkpa na ịntanet, onye ahụ ga-akpachapụ anya maka na ihe ọbụla bara ịntanet dịka ihe ọkụkọ chị ụmụ nụrụ.

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a