Facebook and Google survelliance: A na-enyo ndị na-ele ihe onyonyo mmekọ nwoke na nwaanyị n'ịntanetị?

Ha na-ere njirimara ndị na-ele onyonyo mmekọahụ Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ha na-ere akara njirimara ndị na-ele onyonyo mmekọahụ

Facebook, Google na Oracle na-enyo ma na-eso ndị na-ele ihe onyonyo na-akpali agụụ mmekọrịta nwoke na nwaanyị n'elu Ịntanetị, dịka nchọpụta ụlọntaakụkọ New York Times kwuru.

Ndị ọrụ nchọpụta si ụlọọrụ Microsoft, Carnegie Mellon, na mahadum Pennsylvania nyochara ogige 22,484 nọ n'ịntanetị bụ ebe a na-egosi ihe onyonyo mmekọ nwoke na nwaanyị ịchọpụta akụrụngwa dị n'ime ha.

Akwụkwọ ndị a ewepụtara sị; "Ihe anyị chọpụtara bụ na a na-enyocha ihe ruru ọnụọgụgụ 93% bụ ndị bịara ebe ahụ, ma na-agwa ndị ọzọ ihe ndị mmadụ na-eme."

Ihe a pụtara na onye ọbụla gara ikiri ihe onyonyo mmekọ nwoke na nwaanyị n'ogige Bekee kpọrọ "porn sites" marakwa na anya na-ele ya.

Onye ọkachamara n'ihe gbasara nchekwa n'ịntaneti bụ Maazị Okechukwu Udeogu gwara BBC Igbo na e ji ihe ha chọpụtara, were resi ndị na-eme ihe onyonyo mmekọahụ ka ha were ya mata ụdịrị onyonyo mmekọahụ ndị mmadụ chọrọ ile.

"Ọtụtụ ndị mmadụ amaghị nke a. Mgbe ụfọdụ, ma akara mgbasaozi mmadụ so n'ihe a na-ere," Maazị Udeogu kwuru.

Image copyright Okey Udeogu
Nkenke aha onyonyo Ọtụtụ ndị mmadu amaghị maka nyocha ndị Google na Facebook

Kedụ ọghọm dị n'agwa a nda na-akpa?

  • Ndị omekome na-ezu ihe njirimara ndị mmadụ nwere ike izuru ha n'aka ndị a ma gbaa ya n'anwụ.

Kedụ etu ga-esi gbochie nda inyo ihe na-eme n'ịntanetị?

  • I jiri "In Private Browsing" ha ekwesịghị inyocha ihe ndị mmadụ na-ele n'ịntanetị, ụfodị ndị mmadụ na-ekwu na ha na-enyo kwa nke a.
  • I nwere ike inweta ekwentị maọbụ igwe kọmputa na-enweghị ihe dị mkpa n'ime ya ma were ya na-aga n'ịntanetị.

Ihe Facebook na Google na-ekwu maka ebubo a

Facebook na Google gọrọ ụkwụ na aka ha, sị na ha anaghị eji ihe ha wetere n'ebe a na-egosi ihe onyonyo mmekọ ahazi akụrụngwa e ji ere ahịa.

Onye na-ekwuchitere Google gwara ụlọntaakukọ Business Insider sị: "Anyị anaghị ekwe ka akụrụngwa "Google Ads" baa webụsaịtị na-egosi mmekọ nwoke na nwaanyị.

"Anyị anaghịkwa ekwe ka e gosi mmadụ ihe a na-ere na webụsaịtị site n'ihe o kwuru maọbu mee banyere mmekọ ahụ."

Onye nke Facebook gwara New York Times ihe yiri ihe a. Facebook sị na ụlọọru ha na-amachi webụsaịtị ọbụla ji akụrụngwa ha atụ mgbere.

Akụkọ ga-amasị gị:

Lee ihe nkịrị ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionFacebook: Ụzọ ị ga-eji cheekwa Akara gị

Isiokwu Ndị Emetụtara