Rev Ikechukwu Ilo: Iwe m bụ na ndị uweojii ekweteghị na ọ bụ ndị Fulanị wakporo m

Rev. r. Ikechukwu Ilo Image copyright Ike Ilo
Nkenke aha onyonyo Rev. Fr. Ikechukwu Ilo bụ onye isi nchụaja na St. Patrick Parish, Nome

Onyeisi nchụaja ụka katọlik na St. Patrick Parishi dị na Nome, n'Enugwu steeti ekwuola na ọ bụ ndị Fulani bụ ndị ya huru wakporo ha n'ụzọ.

Fada Ilo kwuru na ọ bụ mgbe o si Enugwu alaghachị na Parishi ya ka nke a mere.

Ikechukwu Ilo nọ n'ụlọọgwụ Annociation dị n'Emene Enugwu anata ọgwụgwọ ugbua kwuru na ihe na-ewute ya bụ na ndị uweojii ekwetaghị ihe ya kwuru na ọ bụ ndị Fulanị wakporo ya.

Ọ sịkwa na ndị uweojii abịabeghị gbaa ya ajụjụ ọnụ ịmata ka ya bụ ọdachị sị dakwasa ya.

Ọ jụrụ BBC sị "eche m ma ọ bụ a na-eme nchọpụta, a ga jụọ ndị ihe ahụ metutara? Ma rue ugbua, onwebeghị ndị uweojii bịara ebe a juo m ajụjụ".

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media caption" Iwe m bụ na ndị uweojii ekweteghị na ọ bụ ndị Fulanị wakporo m" - Rev Ikechukwu Ilo

Ikechukwu sị na gọvanọ Enugwu steeti bụ Ifeanyi Ugwuanyi na ndị ọzọ nwere agba na steeti abịala leta ya ma ndị uweojii abịabeghị.

Ojuru BBC, "Keduzị ka ha ga-esi nọrọ ebe ha nọ sị na ihe m kwuru abụghị eziokwu?"

BBC jụrụ ya ka o sị mata na ndị waporo ya bụ ndị Fulani, ọ zara na ya ma site na ụdị ha na ihe ha yi ụbọchị ahụ.

Ọ sịkwa na n'ezie na ya anụghị asụsụ ha ịmata ndị ha bụ mana na-nkwado ha gosiri na ha bụ ndị Fulani.

Ikechukwu sị na ndị ahụ si na ụgbo akpụ pụta kwawa ha mgbo agharaaghara n'ụgbọala ha ji nke mere mgbo ji kpọpuo ụgbọala ha tụta ya na ọkpa.

Ọ sịkwa na mgbọ metutakwara onye nwaanyị nọ n'ụgbọala ha abụọ so.

BBC kpọtụkwara ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Enugwu steeti bụ Ebere Amarizu bụ onye kwetere na n'ezie na awakporo ya bụ fada.

O kwukwara na ndị ọrụ ha ka na-esi imi n'ala ịmata ndị mere ya bụ ihe.

Amarizu sị na odobeghị anya ka ọ bụ ndị Fulani ka ọ bụ ndị ohi ọzo.

Akụkọ ga-amasị gị

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a